Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 7:3 - Bible Nso

3 Jehova we si Aisaia, Biko, pua izute Ehaz, gi onwe-gi, na Shea-jashub nwa-gi, rue nsọtu uzọ-miri nke ọdọ-miri di n'elu, rue uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Aịzaya okwu sị ya, “Jekwuru Ehaz bụ eze. Mgbe ị na-aga, kpọrọ Shịa-Jashub nwa gị nwoke. Unu ga-ahụ Ehaz nʼakụkụ Elu elu olulu ọdọ mmiri nke dị nʼụzọ ahụ gawara nʼAla ọsụ akwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 7:3
14 Iomraidhean Croise  

N'arọ nke-iri-na-asa nke Peka nwa Remalaia ka Ehaz nwa Jotam, bú eze Juda, malitere ibu eze.


Eze Asiria we si na Lekish zie Tatan na Rab-saris na Rabshake jekuru eze, bú Hezekaia, ha na oké usu-ndi-agha, rue Jerusalem. Ha we rigo biarue Jerusalem. Ha we rigo, bia, guzo n'akuku uzọ-miri nke ọdọ-miri di n'elu, nke di n'uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà.


Ma ihe nile Hezekaia mere nke fọduru, na idi-ike-ya nile, na otú o mere ọdọ-miri, na uzọ-miri, we me ka miri rubata n'obodo, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?


N'iso ya ka Nehemaia nwa Azbuk, bú onye-isi nkera ala di Bet-zua buruburu, mere ka mb͕idi di ike, rue na ncherita-iru ílì Devid, ru kwa ọdọ-miri nke emere, ru kwa ulo ndi-dike.


Jekuru Fero n'ututu; le, ọ nāpu ije miri; i gēguzo onwe-gi n'usọ osimiri Nail izute ya; nkpa-n'aka ahu kwa nke b͕anwere ghọ agwọ, i gēwere ya n'aka-gi.


Ndi fọduru gālaghachikute Chineke Nke bu dike, bú ndi Jekob fọduru.


Ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem ka unu guru ọnu, unu we kwatue ulo nile ilusi mb͕idi ike.


Ebe-nchikọta-miri ka unu me-kwa-ra n'etiti mb͕idi-unu abua inagide miri nke ọdọ-miri ochie: ma unu elegideghi Onye nēme nka anya, ọ bu kwa Onye nākpu ya-ri site n'ebe di anya ka unu nēlekwasighi anya.


Eze Asiria we si na Lekish ziga Rabshake rue Jerusalem jekuru Hezekaia, ya na oké usu-ndi-agha. O we guzo n'akuku uzọ-miri nke ọdọ-miri di n'elu, n'uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà.


onye nēmebi iwu, ya rapu uzọ-ya, onye nēme ajọ ihe, ya rapu èchìchè-ya nile: ya laghachikute kwa Jehova, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru ya; ya laghachikute kwa Chineke-ayi, n'ihi na Ọ gāb͕aghara ya nmehie-ya n'uba.


Ma ọ buru na otù uzọ n'uzọ iri afọdu nime ya, aghaghi irechapu kwa ya ọzọ: dika osisi terebinth, na dika osisi oak, nke ogwe fọduru ha mb͕e eb͕utusiri ha; nkpuru nsọ bu ogwe-ya.


Otú a ka Jehova siri: Rida n'ulo eze Juda, kwue okwu a n'ebe ahu,


Ma Aisaia nēti nkpu bayere Israel, si, Ọ buru na ọnu-ọgugu umu Israel di ka ájá nke oké osimiri, ọ bu nke fọduru ka agāzọputa:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan