Aịzaya 66:4 - Bible Nso4 Mu onwem gārọputa kwa ichì-ọchì nile ha, me kwa ka ihe-ujọ nile ha biakwasi ha; n'ihi na M'kpọrọ òkù, ma ọ dighi onye nāza; ekwurum okwu, ma ha anugh: ha we me ihe jọrọ njọ n'anyam, ọ bu kwa ihe ahu nke nātọghm utọ ka ha rọputara. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a4 Ya mere, aga m ezitere ha ahụhụ dị egwu, mee ka ihe ahụ ha na-atụ egwu ya bịakwasị ha. Nʼihi na mgbe m kpọrọ ha oku, ha azaghị, mgbe m gwara ha okwu, ha egeghị ntị. Kama ha mere ihe ọjọọ nʼihu m, họrọkwa ime ihe ndị ahụ ha maara na m kpọrọ asị.” Faic an caibideil |
Gini mere onye ọ bula adighi mb͕e M'biara? gini mere onye-ọziza adighi mb͕e M'kpọrọ òkù? ọ̀ bu na akam dikara nkpunkpu ma-ọli ib͕aputa? ma-ọbu ọ̀ dighi ike di nimem inaputa? Le, n'ibasi-nba-ikem anameme ka oké osimiri tasia, anameme osimiri ka ha ghọ ọzara: azù-ha nēsì ísì, n'ihi na miri adighi, we nwua n'akpiri-ikpọ-nku.
N'ihi nka gwa ha okwu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye ọ bula n'ulo Israel nke nēme ka arusi nile ya ba n'obi-ya, nke nētiye kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ya na ncherita-iru ya, we biakute onye-amuma; Mu onwem, bú Jehova, gāza ya dika o si di, ya bu dika iba-uba nke arusi-ya nile si di;