Aịzaya 66:3 - Bible Nso3 Onye nēb͕u ehi di ka onye nētib͕u madu; onye ji nwa-aturu achu àjà di ka onye nāb͕aji olu nkita; onye nēsure àjà-nsure-ọku, bú onyinye-inata-iru-ọma, di ka onye nēsure ọbara ezì; onye nēsure frankincense ka ọ buru ihe-ncheta di ka onye nāgọzi ajọ ihe: e, ndi ahu arọputawo uzọ nile nke aka ha, ọ bu kwa ihe-árú nile ha nātọ nkpuru-obi-ha utọ; Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a3 Ma onye ọbụla nke na-achụ aja ehi dịka nwoke na-egbu mmadụ, onye ọbụla jikwa nwa atụrụ achụ aja dị ka onye na-agbaji nkịta olu, onye ọbụla na-achụ aja mkpụrụ ọka dị ka onye na-eche ọbara ezi, otu a kwa, onye ọbụla na-esure ụda na-esi isi ụtọ nke ncheta dị ka onye na-efe arụsị. Ha ahọpụtarala onwe ha ụzọ nke ha, ha na-enwekwa mmasị nʼihe arụ ha niile. Faic an caibideil |
ọ gēweta-kwa-ra umu-ndikom Eron ya, bú ndi-nchu-àjà: o gēsi nime ya weju nweju-aka-ya sitere n'utu ọka flour-ya, site kwa na manu-ya, tiyere frankincense nke ya nile; onye-nchu-àjà gēsure kwa ihe-ncheta-ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, ọ bu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova: