Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 66:24 - Bible Nso

24 Ha gāpu kwa, lekwasi ozu nile nke ndi nējehie ejehie megidem: n'ihi na ikpuru-ha agaghi-anwu, ọku-ha agaghi-anyu kwa; ha gābu-kwa-ra anu-aru nile ihe isọ oyi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 “Ha ga-apụ, jee, lekwasị ozu ndị ahụ niile nwụrụ anwụ anya, bụ ndị ahụ niile nupuru isi megide m. Nʼihi na ikpuru ha agaghị anwụ anwụ, ọkụ a kwanyere agakwaghị anyụ anyụ. Ha ga-abụkwara mmadụ niile ihe na-asọ oyi.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 66:24
24 Iomraidhean Croise  

Ọ gēkpe ikpe n'etiti mba nile, Ebe nile juputara n'ozu; Ọ mapúwo isi madu n'elu ọtutu ala.


Ma ntipia nke ndi nēmebi iwu na ndi-nmehie gādi n'otù, agēme kwa ka ndi nārapu Jehova gwusia.


Ọgaranya gāghọ kwa eriri-nzuzu, ọlu-ya gāghọ kwa icheke-ọku; ha abua gēre kwa ọku n'otù, ọ dighi kwa onye nēmenyu ha.


Emewo ka nbili-elu-gi ridarue ala-mọ, ya na olu une-gi nile: n'okpuru gi ka ab͕asaworo ikpuru, ihe-nkpuchi-gi bu kwa ikpuru.


Uwa gāṅaghari nke-uku dika onye ṅubigaworo manya ókè, ọ gādaghari dika ulo-ọnọdu-abali; njehie-ya gādi kwa arọ́ n'aru ya, o we da, ghara ibili kwa ọzọ.


Jehova, ebuliwo aka-Gi, ma ha adighi-ahu: ha gāhu ekworo I nēkworo ndi-Gi, ihere ewe me ha; ọzọ, ọku nke ndi nēmegide Gi gērichapu ha.


N'abali ma-ọbu n'ehihie ọ gaghi-anyu anyu; rue mb͕e ebighi-ebi ka anwuru-ọku-ya gākwugo: site n'otù ọb͕ọ rue ọb͕ọ ọzọ ọ gātọb͕ọrọ n'efu; rue mb͕e nile ebighi-ebi ọ dighi onye nāgabiga nime ya.


Agētufu kwa ndi-ha eb͕uru eb͕u, ma ozu-ha, ísì ọjọ ha gārigo n'elu, agāb͕aze kwa ugwu site n'ọbara-ha.


Ọ dighi udo diri ndi nēmebi iwu, ka Jehova siri.


N'ihi nka ka iwe Jehova di ọku n'aru ndi-Ya, O we setipu aka-Ya megide ha, tib͕ue ha, ugwu nile we ma jijiji, ozu ndi ahu we di ka ǹsí-anu n'etiti èzí nile. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


N'ihi na nla gērichapu ha dika uwe, aruru gērichapu kwa ha dika aji-anu: ma ezi omumem gādiru mb͕e ebighi-ebi, nzọputam gādiru kwa ọb͕ọ nile.


Unu gārapu aha-unu n'azu ighọrọ ndi M'rọputaworo ihe-ọb͕ub͕a-iyi, Onye-nwe-ayi Jehova gēme kwa ka i nwua; ma Ọ gākpọ ndi-orù-Ya aha ọzọ:


N'ihi na ọku ka Jehova gēji soro anu-aru nile, bú madu, je ikpé, Ọ gēji kwa mma-agha-Ya: ndi Jehova b͕uworo gaba uba.


Ọzọ, ọtutu madu nime ndi nāraru ura n'ala, bú ájá, gēteta, ufọdu ibà na ndu ebighi-ebi, ufọdu ibà n'ita-uta riri nne na oyi agāsọ ha nke-uku mb͕e ebighi-ebi.


Nka gābu kwa ihe-otiti nke Jehova gēji ti ndi nile di iche iche ndi busoworo Jerusalem agha: anu-aru-ha nile n'otù n'otù gātasi ata mb͕e ha onwe-ha nēguzo n'ukwu-ha, anya-ha gātasi kwa ata n'oghere-ha, ire-ha gātasi kwa ata n'ọnu-ha.


Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, Ọ gāfuchapu kwa ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, Ọ gēkpokọta kwa ọka-Ya n'ọba-Ya, ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o.


Ma ndi nātu ujọ, na ndi nēkweghi ekwe, na ndi-árú, na ndi-ob͕u-madu, na ndi nākwa iko, na ndi nāgwọ ńsí, na ndi nēkpere arusi, na ndi-ugha nile, òkè-ha gābu nime ọdọ ahu nke ji ọku na brimstone nēre; nke bu ọnwu nke-abua ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan