Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 65:9 - Bible Nso

9 M'gēme kwa otù nkpuru ka o si na Jekob puta, na otù onye-nnweta nke ugwum nile ka o si na Juda puta: ndi M'rọputaworo ewe nweta ya, ndi-orùm gēbi kwa n'ebe ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta, sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile. Ndị m họpụtara ga-eketa ha, ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 65:9
25 Iomraidhean Croise  

N'ọdi-n'iru Jekob gāb͕a nkpọrọgwu: Israel gāb͕awa okoko dika osisi, ma ifuru: ha we mejue iru elu-uwa dum madu bi n'ihe-omume.


N'ihi na otù ndi gēbi na Zaion nime Jerusalem: i gaghi-akwa ákwá ọzọ ma-ọli: Ọ gēmere gi amara n'ezie n'olu iti-nkpu-gi; mb͕e Ọ nuru Ọ gāza gi otù mb͕e ahu.


Ndim gānọ kwa n'ulo-obibi udo, na n'ebe-obibi di iche iche kwesiri ntukwasi-obi, na n'ebe-izu-ike di iche iche di jū.


Ọ bughi na nzuzo ka M'kwuworo okwu, n'otù ebe nke ala ọchichiri; asighm nkpuru Jekob, Chọnum n'ebe tọb͕ọrọ n'efu: Mu onwem bu Jehova, Onye nēkwu ezi omume, Onye nēgosi ihe di iche iche ziri ezi.


Na Jehova ka agāgu nkpuru nile nke Israel na ndi ezi omume, ọ bu kwa na Ya ka ha gānya isi.


Otú a ka Jehova siri, Na mb͕e ihe madu nātọm utọ ka M'zaworo gi, ọ bu kwa n'ubọchi nzọputa ka M'nyeworo gi aka: M'gēchebe kwa gi, nye gi ka i buru ọb͕ub͕a-ndu nke ndim, ime ka ala bilie, ime ka ha keta ihe-nketa nile tọb͕ọrọ n'efu;


Mb͕e i nēti nkpu, ka ndi i chikọtaworo naputa gi; ma ha nile ka ifufe gēfepu, otù nku-ume gēkupu ha: ma onye ahu nke nab͕abà nimem gēketa ala, nweta kwa ugwu nsọm.


Ndi-gi kwa, ha nile gābu ndi ezi omume, rue mb͕e ebighi-ebi ka ha gēnweta ala; alaka nke ọkukúm, ọlu akam, ime ka M'ma nma.


Unu gārapu aha-unu n'azu ighọrọ ndi M'rọputaworo ihe-ọb͕ub͕a-iyi, Onye-nwe-ayi Jehova gēme kwa ka i nwua; ma Ọ gākpọ ndi-orù-Ya aha ọzọ:


Ha agaghi-ewu ulo, onye ọzọ ebichie; ha agaghi-aku, onye ọzọ erie: n'ihi na dika ubọchi nile nke osisi si di, otú a ka ubọchi nile nke ndim gādi, ndi M'rọputaworo gēnwe kwa ihe aka-ha lutara mb͕e di anya nke-uku.


M'gēweputa kwa unu n'etiti mba nile, chikọputa kwa unu n'ala nile, me ka unu bata n'ala-unu.


Na mb͕e ahu ka M'gēme ka unu bata, ọ bu kwa na mb͕e ahu ka M'gāchikọta unu: n'ihi na M'gēme ka unu ghọ aha, ghọ kwa otuto n'etiti ndi nile di iche iche nke uwa, mb͕e M'gēme ka ndi-unu adọtara n'agha lata n'anya-unu, ka Jehova siri.


Ọ buru kwa na emeghi ubọchi ahu ka ha di nkpirikpi, agaghi-azọputa madu ọ bula: ma n'ihi ndi arọputara agēme ka ubọchi ahu di nkpirikpi.


N'akuku ozi ọma, ha bu ndi-iro n'ihi unu: ma n'akuku nrọputa, ha bu ndi ahuru n'anya n'ihi nna-ayi-hà.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan