Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 65:8 - Bible Nso

8 Otú a ka Jehova siri, Dika anāchọta manya-vine ọhu n'uyọkọ nkpuru-vine, ewe si, Ebibila ya, n'ihi na ngọzi di nime ya: otú a ka M'gēme N'ihi ndi-orùm, ka M'we ghara ibibi ha nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnị ndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya, nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’ otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m; Agaghị m ebibicha ha niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 65:8
14 Iomraidhean Croise  

Jehova we si, Ọ buru na achọtam nime Sọdọm ọgu ndi ezi omume abua na iri n'etiti obodo ahu, M'gāb͕aghara ebe ahu nile n'ihi ha.


Ọ buru na Jehova nke usu nile nke ndi-agha emeghi madu ole-na-ole nke fọduru ka ha fọduru ayi, ayi gādiwori ka Sọdọm, ayi gēyiwori Gọmọra.


Ndi fọduru gālaghachikute Chineke Nke bu dike, bú ndi Jekob fọduru.


N'ihi na ọ buru na ndi-gi, Israel, adi ka ájá oké osimiri, nání ndi fọduru nime ha gālata: nkpochapu ka akaworo àkà, nke nērubiga ókè n'ezi omume.


N'ihi aham ka M'nēme ka iwem nọ ọdù, ọ bu kwa n'ihi otutom ka M'nēb͕ochi ya n'ebe i nọ, ka M'we ghara ibipu gi.


Ma ọ buru na otù uzọ n'uzọ iri afọdu nime ya, aghaghi irechapu kwa ya ọzọ: dika osisi terebinth, na dika osisi oak, nke ogwe fọduru ha mb͕e eb͕utusiri ha; nkpuru nsọ bu ogwe-ya.


N'ihi na gi ka M'nọyere, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), izọputa gi: n'ihi na M'gēme ka mba nile gwusia, bú ebe M'chusaworo gi, ma otú ọ di, gi ka M'nāgaghi-eme ka i gwusia: ma M'gādọ gi aka na nti n'ikpé, M'gaghi-asi kwa na i bu onye ikpe nāmaghi ma-ọli.


Ònye mara? eleghi anya O gēchighari, chègharia uche, me ka ngọzi fọdu n'azu Ya; bú onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu inye Jehova, bú Chineke-unu.


Ọ buru kwa na emeghi ubọchi ahu ka ha di nkpirikpi, agaghi-azọputa madu ọ bula: ma n'ihi ndi arọputara agēme ka ubọchi ahu di nkpirikpi.


Ọ buru kwa na Onye-nwe-ayi emeghi ubọchi ahu ka ha di nkpirikpi, agaghi-azọputa madu ọ bula: ma n'ihi ndi arọputara, ndi Ọ rọputara, O mere ka ubọchi ahu di nkpirikpi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan