Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 65:6 - Bible Nso

6 Le, ọ bu ihe edeworo n'akwukwọ n'irum: M'gaghi-agba nkiti, kama M'gākwughachi, e, M'gākwughachi n'obi-ha,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 “Lee, edeela ya rịị nʼihu m sị: Agaghị m agba nkịtị, aga m akwụghachi nʼuju. E, aga m akwụghachi ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 65:6
22 Iomraidhean Croise  

Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche neweda onwe-ha n'ala Site n'uzọ njehie-ha na site n'ajọ omume nile ha.


Ka echetara Jehova ajọ omume nna-ya-hà; Ekwe-kwa-la ka ehichapu nmehie nne-ya.


Ihe ndia ka i meworo, M'we b͕a nkiti; I chère na adizum ka i di: M'gābara gi nba, do kwa ya n'usoro n'anya-gi.


Ka Chineke-ayi bia, Ya ab͕a-kwa-la nkiti: Ọku nēripia n'iru Ya, Buruburu Ya ka ifufe nēfesi kwa ike nke-uku.


Nwagharim ka Gi onwe-gi guworo ọnu: Tiye anya-mirim nile nime karama-akpukpọ-Gi; Hà adighi n'akwukwọ-Gi:


Gi nyeghachi kwa ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta-ha nime obi-ha okpukpu asa, Bú nke ha jiri ta Gi uta, Onye-nwe-ayi.


Jehova we si Moses, De nka n'akwukwọ, ka ọ buru ihe-ncheta, me kwa ka ọ ba na nti Joshua: n'ihi na M'gēhichapusi ncheta Amalek n'okpuru elu-igwe.


N'ihi na, le, Jehova nēsi n'ọnọdu-Ya aputa iji ajọ omume nke ndi bi n'uwa leta ha: ọzọ, ala gēkpughe ọbara-ya, ọ gaghi-ekpuchi kwa ndi-ya eb͕uru eb͕u ọzọ.


Ahuhu gādiri onye nēmebi iwu! ọ gādiri ya njọ: n'ihi na nmeso aka-ya abua mesoro madu ka agēme ya.


Edebewom ọnum du site na mb͕e ebighi-ebi gara aga; anamab͕a nkiti, jisie onwem ike: dika nwanyi ime neme, otú a ka M'gāsu, udè, ku ume ngwa ngwa, Kusie ume ike n'otù.


Dika nmeso nile ha si di, otú a ka Ọ gākwughachi, ọnuma ka Ọ gākwughachi ndi nēmegide Ya, nmeso-ha ka Ọ gākwughachi ndi-iro-Ya; Ọ gākwughachi agwe-etiti nile nmeso-ha.


Mb͕e anēme ihe ndia, Ì gējisi Onwe-gi ike, Jehova? Ì gāb͕a nkiti, we weda ayi n'ala nke-uku?


Ge nti, olu nkpọtu nēsite n'obodo, olu nēsite n'ulo uku Chineke, bú olu Jehova Onye nākwughachi ndi-iro-Ya nmeso-ha.


Ma M'gēburu uzọ kwughachi ajọ omume-ha na nmehie-ha okpukpu abua; n'ihi na ha emewo alam ka ọ ghara idi nsọ n'ozu nke nile ha nke nāsọ oyi, ọ bu kwa ihe-árú nile ha ka ha ji kpojue ihe-nketam.


Ma ndi obi-ha nējeso obi nke ihe nile ha nke jọb͕uru onwe-ha na ihe-árú nile ha, uzọ-ha ka M'gātukwasi n'isi ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


M'we wukwasi ha ajọ iwem dika miri; ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'jiworo me ka ha gwusia: uzọ-ha ka M'tiyekwasiworo n'isi-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ma Mu onwem kwa, anyam agaghi-enwe ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko, uzọ-ha ka M'gētiyekwasi n'isi-ha.


Ọzọ kwa, gini ka unu gēmem, unu Taia na Zaidon na buruburu-ala nile nke Filistia? Ọ̀ di nmeso M'mesoworo unu unu onwe-unu nākwughachim, ma ọ̀ bu na ihe di unu onwe-unu nēmesom? M'gēji ngwa na ọsọ nyeghachi nmeso-unu n'isi-unu.


Mḅe ahu ndi nātu egwu Jehova nēkwurita okwu, otú onye na ibe-ya: Jehova we ṅa nti, nu, ewe dere ndi nātu egwu Jehova, ndi nēchè kwa èchìchè aha-Ya, akwukwọ ncheta n'iru Ya.


nēnyenu, agēnye kwa unu; ọtùtù ọma, nke abiadaworo ala, yọkọta, nke nējubiga kwa ókè, ka ha gēnye n'obi-unu. N'ihi na ihe unu ji tù ihe ka agēji tùkwara unu ọzọ.


Ǹka abughi ihe akwakọbaworo n'ebe m'nọ, Ihe akaworo akàrà n'ulo-àkùm?


M'we hu ndi nwuru anwu nile, ndi uku na ndi ntà, ka ha nēguzo n'iru oche-eze ahu; ewe saghe akwukwọ di iche iche: asaghe-kwa-ra akwukwọ ọzọ, nke bu akwukwọ nke ndu: ewe kpe ndi nwuru anwu ikpé site n'ihe nile edereri n'akwukwọ ahu di iche iche, dika ọlu nile ha si di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan