Aịzaya 65:2 - Bible Nso2 Ab͕asawom akam abua ogologo ubọchi nile nye otù ndi nke nēwezuga onwe-ha, ndi nēje ije n'uzọ nādighi nma, nēso èchìchè nile nke aka ha; Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a2 Ogologo ụbọchị niile ka m gbasapụrụ aka m abụọ nye ndị na-enupu isi, bụ ndị na-agbaso ụzọ na-ezighị ezi ndị a na-agbaso ihe ọbụla ha tụpụtara nʼuche ha, Faic an caibideil |
Onye nēb͕u ehi di ka onye nētib͕u madu; onye ji nwa-aturu achu àjà di ka onye nāb͕aji olu nkita; onye nēsure àjà-nsure-ọku, bú onyinye-inata-iru-ọma, di ka onye nēsure ọbara ezì; onye nēsure frankincense ka ọ buru ihe-ncheta di ka onye nāgọzi ajọ ihe: e, ndi ahu arọputawo uzọ nile nke aka ha, ọ bu kwa ihe-árú nile ha nātọ nkpuru-obi-ha utọ;