Aịzaya 65:11 - Bible Nso11 Ma unu onwe-unu ndi nārapu Jehova, ndi nēchezọ ugwu nsọm, ndi nēdoro Gad table n'usoro, ndi nāb͕ajuru Meni manya gwara ọgwa; Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a11 “Ma unu ndị wezugara onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ, ndị chezọrọ ugwu nsọ m, ndị na-edozi tebul maka Ihuọma, ndị na-agbaju mmanya agwara ọgwa nʼiko maka Akara aka. Faic an caibideil |
Ma gi onwe-gi, Solomon nwam, mara Chineke nke nna-gi, were obi zuru okè, were kwa nkpuru-obi ọ nātọ utọ, fè Ya òfùfè: n'ihi na nkpuru-obi nile ka Jehova nēnyocha, Ọ nāghọta kwa nchèputa nile ọ bula nke èchìchè: ọ buru na i chọ Ya, Ọ gēme ka i chọta Ya; ma ọ buru na i rapu Ya, Ọ gāju gi rue mb͕e ebighi-ebi.
Ha gēme kwa umu-nne-unu nile ka ha si na mba nile bia ibu onyinye-inata-iru-ọma enyere Jehova, n'elu inyinya, na n'ub͕ọ-ala, na n'ub͕ọ-ala nwere ihe-okpukpu, na n'elu inyinya mule, na n'elu anu di ngwa, rue ugwu nsọm, bú Jerusalém, ka Jehova siri, dika umu Israel si ewebata onyinye-inata-iru-ọma-ha n'ulo Jehova n'ihe di ọcha.