Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 64:1 - Bible Nso

1 Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na I gādọwa elu-igwe, ridata, ma asi na ugwu nile gēsi n'iru Gi rùda dika miri;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ọ gaara adị mma ma asị na ị ga-adọwa eluigwe rịdata nʼala, ma asị nʼugwu ukwu niile ga-ama jijiji nʼihu gị!

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 64:1
22 Iomraidhean Croise  

Mba nile ozo b͕ara aghara, ewezugara ala-eze nọnọdu-ha: O mere ka olu-Ya da, uwa nabaze.


Ala mara jijiji, Ọzọ, elu-igwe buru miri n'iru Chineke: Sainai ahu mara jijiji n'iru Chineke, bú Chineke nke Israel.


N'ìhi gini ka mba nile nāsi, Òle ebe Chineke-ha nọ? Ka amara ya n'etiti mba nile n'anya-ayi, Bú ibọ̀-ọ́bọ̀ ọbara nke ndi-orù-Gi nke awusiworo.


nọ na njikere nye ubọchi nke-atọ: n'ihi na ọ bu n'ubọchi nke-atọ ka Jehova gāridata n'anya ndi Israel nile n'elu ugwu Sainai.


M'we ridata inaputa ha n'aka ndi Ijipt, na ime ka ha si n'ala ahu rigorue ala di nma nke sa-kwa-ra mbara, rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya; rue ebe nke ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus.


Le, emewom ka i ghọ ihe-nkpọre eji azọcha ọka, bú ihe di nkọ di ọhu nwere ezé: i gāzọcha ugwu, zọpia ha, i gēme kwa ugwu ntà ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka.


Si n'elu-igwe legide anya, si kwa n'ebe-obibi nke idi-nsọ-Gi na nke ima-nma-Gi le: òle ebe ekworo-Gi na idi-ike-Gi nile di? idà-udà nke ngiri-afọ-Gi na obi-ebere-Gi nile n'ebe m'nọ jisiri onwe-ha ike.


Ayi aghọwo ndi I nāchighi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ndi anākpọkwasighi ha aha-Gi.


Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e onye-plough gēkwudo onye nēbì ọka, onye-nzọcha-nkpuru-vine gēkwudo kwa onye nāgha nkpuru-ọghigha; ugwu nile gēme ka manya-vine utọ nābusa, ugwu ntà nile gāb͕aze kwa.


Ọ bu kwa Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bu Onye nēmetu ala, o we b͕aze, ndi nile ndi bi nime ya ewe rue újú; ọ gērujucha kwa dika osimiri Nail, we tacha, dika osimiri Nail nke Ijipt;


Ukwu-Ya abua gēguzo kwa n'ubọchi ahu n'elu ugwu Olive, nke di n'iru Jerusalem n'Iru-anyanwu, ugwu Olive gāb͕awa kwa n'etiti abua ya n'akuku Ọwuwa-anyanwu na n'akuku Ọdida-anyanwu, oké ndagwurugwu di uku ewe di; nkera ugwu ahu gāpuzuga n'akuku Ugwu, nkera-ya n'akuku Ndida.


Ngwa ngwa mb͕e O si na miri nārigo, Ọ huru elu-igwe ka ha nādọwa, Ọ hu-kwa-ra Mọ Nsọ dika nduru ka Ọ nēfedakwasi Ya:


M'we hu oké oche-eze di ọcha, na Onye nānọkwasi ya, Onye uwa na elu-igwe b͕apuru n'iru Ya; ahughi kwa ebe ọ bula nye ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan