Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 63:5 - Bible Nso

5 M'we legide anya, ma ọ dighi onye nēne aka; ibobo we nwuam n'aru na ọ̀ dighi onye nākwagide: ogwe-akam we wetaram nzọputa; ọnumam kwa, ya kwagiderem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Elere m anya ma o nweghị onye bịara inyere m aka. O juru m anya, jukwa m ọnụ, na o nweghị onye pụtara inyere m aka. Nʼihi ya, aka m wetara m mmeri. Ọ bụkwa ọnụma juru m obi gbara m ume imezu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 63:5
19 Iomraidhean Croise  

O we me ka obi-ha ruru ala n'idọb͕u onwe-ha n'ọlu; Ha suru ngọngọ, ọ dighi kwa onye nēyere ha aka.


Anọlam n'ebe dí anya; n'ihi na nkpab͕u di nso; N'ihi na ọ dighi onye nēyerem aka.


N'ihi na ọ bughi mma-agha-ha ka ha ji nweta ala ahu, Ogwe-aka-ha azọputaghi kwa ha: Kama ọ bu aka-nri-Gi, na ogwe-aka-Gi, na ìhè nke iru-Gi, N'ihi na ihe-ha tọrọ Gi utọ.


Ita-uta etiwawo nkpuru-obim; anamariasi kwa ọria ike: M'we le anya onye gēgosim ebere o ji n'arum, ma ọ dighi onye ọ bula; M'le-kwa-ra anya ndi-nkasi-obi, ma achọtaghm onye ọ bula.


Ònye gēbilirim imegide ndi nēme ihe ọjọ? Ònye gēme onwe-ya ka o guzosierem ike imegide ndi nālu ajọ ihe?


Bùkuenu Jehova abù ọhu; N'ihi na Ọ luwo oké ọlu di iche iche; Aka-nri-Ya na ogwe-aka-Ya di nsọ enyewo Ya nzọputa.


Le, Ọnye-nwe-ayi Jehova gābia dika onye di ike, ogwe-aka-Ya ganāchi-kwa-ra Ya: le, ọkwukwu-ugwọ-Ya di n'aka-Ya, ugwọ-ọlu-Ya di kwa n'iru Ya.


M'we le, ma ọ dighi onye M'huru; n'etiti ndia kwa, ma ọ dighi onye-ndum-ọdu di, ka M'we jua ha ajuju, ha we zaghachim okwu.


Gini mere onye ọ bula adighi mb͕e M'biara? gini mere onye-ọziza adighi mb͕e M'kpọrọ òkù? ọ̀ bu na akam dikara nkpunkpu ma-ọli ib͕aputa? ma-ọbu ọ̀ dighi ike di nimem inaputa? Le, n'ibasi-nba-ikem anameme ka oké osimiri tasia, anameme osimiri ka ha ghọ ọzara: azù-ha nēsì ísì, n'ihi na miri adighi, we nwua n'akpiri-ikpọ-nku.


Ezi omumem di nso, nzọputam aputawo, ogwe-akam abua gēkpe ndi nile ikpe; agwe-etiti nile gēle anyam, ọ bu ogwe-akam ka ha gēchere.


Teta, teta, yiri ike dika uwe, gi ogwe-aka Jehova; teta, dika n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, bú ọb͕ọ nile nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga. Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu ihe ahu nke kpọwasiworo Rehab, nke mapúworo ogologo anu-miri?


Jehova ab͕abawo ogwe-aka-Ya di nsọ ọtọ n'anya mba nile; nsọtu nile nke uwa we hu nzọputa nke Chineke-ayi.


Ebe-nzọcha-nkpuru-vine ka M'zọchara, náním; ma nime ndi nile di iche iche ọ dighi onye ọ bula Mu na ya nọ: M'we zọcha ha n'iwem, zọda ha n'ọnumam; ọbara-ndu-ha we fesa n'uwem nile, ọ bu kwa uwe-oyiyim nile ka M'meruru emeru.


M'we chọ otù onye n'etiti ha, onye gaje ib͕a ogige, guzo kwa na ntipú n'irum n'ihi ala-ya, ka M'we ghara ibibi ya: ma achọtaghm.


Ma n'aru ulo Juda ka M'gēnwe obi-ebere, M'gēji kwa Jehova, bú Chineke-ha, zọputa ha, ma M'gaghi-eji uta, ma-ọbu mma-agha, ma-ọbu agha, ma-ọbu inyinya, ma-ọbu ndi-inyinya, zọputa ha.


Le, oge hour nābia, ọ biawo kwa, ka unu gāb͕asa, onye ọ bula ọ la na nke ya, unu gārapu kwa nání Mu: otú ọ di, nání Mu anọghi, n'ihi na Mu na Nnam nọ.


ma Ọ buru ndi akpọrọ, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, Kraist, bú ike nke Chineke, na amam-ihe nke Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan