Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 62:9 - Bible Nso

9 kama ndi chikọtaworo ya gēri ya, we to Jehova; ndi kpokọtaworo ya gāṅu kwa ya n'ogige nsọm nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ma ndị were ya ka ihe ubi ga-eri ya, tookwa Onyenwe anyị, ndị kpokọtara oroma grepu ga-aṅụ ya nʼime ogige ebe nsọ m.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 62:9
13 Iomraidhean Croise  

N'ìhi gini ka unu nātù ego inye n'ọnọdu ihe nābughi nri? nà ihe putara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọnọdu ihe nke nādighi-eju afọ? genum nti nke-ọma, rie ezi ihe, ka ihe nke mara abuba tọ kwa nkpuru-obi-unu utọ.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji kwue otú a, si, Le, ndi-orùm gēri ihe, ma agu gāgu unu onwe-unu: le, ndi-orùm gāṅu, ihe-ọṅuṅu, ma akpiri gākpọ unu onwe-unu nku: le, ndi-orùm gāṅuri ọṅu, ma ihere gēme unu onwe-unu:


Ha gēwu kwa ulo, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, rie nkpuru-ha.


Ha agaghi-ewu ulo, onye ọzọ ebichie; ha agaghi-aku, onye ọzọ erie: n'ihi na dika ubọchi nile nke osisi si di, otú a ka ubọchi nile nke ndim gādi, ndi M'rọputaworo gēnwe kwa ihe aka-ha lutara mb͕e di anya nke-uku.


I gāku kwa ubi-vine ọzọ n'elu ugwu nile nke Sameria: ndi nāku vine gāku, me ka ha pua na nsọ anāsọ ha.


O we me akuku-ọnu-uzọ, ọgu cubit atọ; ọbuná rue akuku-ọnu-uzọ nke ogige, ọnu-uzọ-ama di buruburu n'akuku nile.


Unu gēriju afọ, afọ ewe ju unu, unu ewe to aha Jehova, bú Chineke-unu, Onye mesoworo unu n'ilu oké ọlu: ihere agaghi-eme kwa ndim rue mb͕e ebighi-ebi.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ buru na i je ije n'uzọm nile, ọ buru kwa na i debe ihe-ndebem, ọ gābu kwa na gi onwe-gi gēkpe ulom ikpe, ọzọ, i gēdebe kwa ogigem nile, M'gēnye kwa gi ebe-njeghari di iche iche n'etiti ndia nēguzo n'ebe a.


unu gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, unu onwe-unu, na umu-unu ndikom, na umu-unu ndinyom, na orù-unu ndikom, na orù-unu ndinyom, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-unu ọ bula; n'ihi na o soghi unu nwe òkè ma-ọbu ihe-nketa.


unu gēri kwa ihe n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, unu gāṅuri kwa ọṅu n'ihe nile unu nēseti aka-unu ime, unu onwe-unu na ulo-unu, nke Jehova, bú Chineke-gi, gọziworo gi nime ha.


i gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ n'etiti gi, n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu.


i gāṅuri kwa ọṅu n'ememe-gi, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai, na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan