Aịzaya 62:4 - Bible Nso4 Agaghi-agu kwa gi aha Nwanyi arapuru arapu ọzọ; agaghi-agukwa ala-gi aha Ala tọb͕ọrọ n'efu ọzọ: n'ihi na gi ka agākpọ Hefzi-ba, agākpọ kwa ala-gi Beula: n'ihi na ihe-gi nātọ Jehova utọ, agālu kwa ala-gi dika nwunye. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a4 A gakwaghị akpọ gị onye ahapụrụ ahapụ, maọbụ kpọọ ala gị ala tọgbọrọ nʼefu. Ma a ga-akpọ gị Hefziba, kpọkwa ala gị Beula, nʼihi na ihe gị ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, a ga-alụkwa ala gị dịka nwunye. Faic an caibideil |
Obi gātọm utọ nke-uku nime Jehova, nkpuru-obim gēteghari egwú ọṅù nime Chinekem; n'ihi na Ọ chiriwo uwe nzọputa yikwasim, O werewo uwe-nwuda ezi omume kpuchiem, dika onye nālu nwunye ọhu si ewere ihe ọma ike n'isi ke onwe-ya dika onye-nchu-àjà, na dika nwanyi anālu ọhu si ewere ihe-ejiji-ya nile chọ onwe-ya nma.