Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 60:8 - Bible Nso

8 Òle ndi bu ndia nke nēfe efe dika igwe-oji, ndi nēfe kwa dika nduru si eferue window-ha?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 “Olee ndị bụ ndị a na-efegharị dịka igwe ojii, ndị na-efegharị dịka ụmụ nduru na-efeba nʼakwụ ha?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 60:8
8 Iomraidhean Croise  

Chenum iru, ewe zọputa unu, unu nsọtu nile nke uwa: n'ihi na Mu onwem bu Chineke, ọ dighi kwa Chineke ọzọ di.


I gāsi kwa n'obi-gi, Ònye muru ndia nyem, ebe mu onwem bu onye ab͕abaworo aka umu, na nwanyi-àgà, na onye emeworo ka ọ je biri n'ala ọzọ, na onye ewezugara ewezuga? ma ndia, ònye mere ka ha toputa? Le, mu onwem fọduru, náním; ndia, òle ebe ha nọ?


Welie anya-gi abua le buruburu, hu: ha nile achikọtawo onwe-ha, ha abiakutewo gi: umu-gi ndikom gēsi n'ebe di anya bia, agēku kwa umu-gi ndinyom n'akuku-gi.


Ha gēsi n'Ijipt bia nāma jijiji dika nnunu, si kwa n'ala Asiria dika nduru: M'gēme kwa ka ha biri n'ulo nile ha: ọ bu ihe si n'ọnu Jehovaa puta.


Ha gēsi kwa n'Ọwuwa-anyanwu na Ọdida-anyanwu, si kwa n'Ugwu na Ndida, bia, nọdu kwa n'ala-eze Chineke.


Ya mere ka ayi onwe-ayi, ebe ayi nwere oké ìgwè ndi-àmà di otú a ndi b͕ara ayi gburugburu dika igwe-oji, ka ayi tupu kwa ibu nile ọ bula, ya na nmehie ahu nke nārapara ayi n'aru nke-uku, ka ayi were kwa ntachi-obi b͕a ọsọ ahu edebere ayi n'iru,


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpughi iguta ọnu, ndi si na mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n'iru oche-eze ahu na n'iru Nwa-aturu ahu, eb͕okwasiworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n'aka-ha;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan