Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 60:4 - Bible Nso

4 Welie anya-gi abua le buruburu, hu: ha nile achikọtawo onwe-ha, ha abiakutewo gi: umu-gi ndikom gēsi n'ebe di anya bia, agēku kwa umu-gi ndinyom n'akuku-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 “Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu, ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị; ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa, ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 60:4
18 Iomraidhean Croise  

Ọ gēbuli-kwa-ra mba nile ọkọlọtọ, we chikọta ndi Israel achupuru achupu, ndi Juda b͕asara ab͕asa ka Ọ gēsi na nkuku anọ nke uwa kpọkọputa kwa.


Ndi nile di iche iche gēkuru kwa ha, me ka ha biarue ọnọdu-ha: ulo Israel gēketa kwa ha n'ala Jehova ibu ndi-orù na ibu ndinyom nēje ozi: ha gāghọ kwa ndi nādọta ndi nādọta ha-ri n'agha n'agha; ha gēnwe kwa ike n'aru ndi nāchi ha-ri n'ihe-ike.


Mu onwem, bú Jehova, akpọwo gi n'ezi omume, M'gējide kwa aka-gi, chebe gi, nye gi ka i buru ọb͕ub͕a-ndu nke ndim, ka i buru kwa ìhè nke mba nile;


M'gāsi Ugwu, Nye; si kwa Ndida, Eb͕ochila: me ka umum ndikom si n'ebe di anya bia, gi me kwa ka umum ndinyom si na nsọtu uwa bia;


Le, ndia gēsi n'ebe di anya bia: le kwa, ndia gēsi n'Ugwu na n'Ọdida-anyanwu; ndia gēsi kwa n'ala Sainim.


Umu-gi emewo ngwa; ndi nākwada gi na ndi nēme ka i tọb͕ọrọ n'efu gēsi nime gi pua.


Welie anya-gi abua le buruburu, we hu: ndia nile achikọtawo onwe-ha, biakute gi. Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta,) n'ezie ha nile ka i gēyiri dika ihe-ichọ-nma, were ha ke, dika nwunye ọhu.


Ha gēme kwa umu-nne-unu nile ka ha si na mba nile bia ibu onyinye-inata-iru-ọma enyere Jehova, n'elu inyinya, na n'ub͕ọ-ala, na n'ub͕ọ-ala nwere ihe-okpukpu, na n'elu inyinya mule, na n'elu anu di ngwa, rue ugwu nsọm, bú Jerusalém, ka Jehova siri, dika umu Israel si ewebata onyinye-inata-iru-ọma-ha n'ulo Jehova n'ihe di ọcha.


Ma gi onwe-gi, atula egwu, gi orùm, bú Jekob, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); atu-kwa-la ujọ, gi Israel: n'ihi na, le, M'gaje izọputa gi n'ebe di anya, zọputa kwa nkpuru-gi n'ala ọzọ ebe emere ka ha je biri; Jekob gālata kwa, nọ jū n'aru bū, ọ dighi kwa onye ganēme ka ọ ma jijiji.


M'gēme kwa ka ndim adọtara n'agha, bú Israel, lata, ha gēwu kwa obodo nile tọb͕ọrọ n'efu, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, ṅua manya-ha; ha gēme kwa ubi ab͕ara ogige, rie nkpuru-ha.


N'ubọchi ahu ọ bu kwa gi ka agābiakute, site n'Asiria na obodo nile nke Ijipt, site kwa n'Ijipt we rue Osimiri, site kwa n'oké osimiri rue oké osimiri, site kwa n'ugwu rue ugwu.


M'gēme kwa ka mba nile me nkpatu, ihe anāchọsi ike nke mba nile gābia kwa, M'gēmeju kwa ulo a n'ebube, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Ma asim unu, na ọtutu madu gēsi n'Ọwuwa-anyanwu na Ọdida-anyanwu bia, so kwa Abraham, na Aisak, na Jekob, nānọdu n'ala-eze elu-igwe:


Ùnu onwe-unu asighi, Ọnwa anọ fọduru, owuwe-ihe-ubi ewe bia? le, asim unu, Welienu anya-unu elu, kiri ubi, na ha chara acha ub͕u a ka ewere ihe di nime ha.


Ma n'ubọchi-izu-ike soni ọ fọduru ihe ntà ka obodo ahu nile zukọ inu okwu Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan