Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 60:10 - Bible Nso

10 Umu ala ọzọ gēwu kwa mb͕idi-gi nile, ndi-eze-ha gēje-kwa-ra gi ozi: n'ihi na n'iwem ka M'tiworo gi ihe, ma na mb͕e ihe-gi nātọm utọ ka M'nweworo obi-ebere n'aru gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 “Ndị mba ọzọ ga-abịa wuziere unu mgbidi unu niile. Ndị na-achị achị na ndị eze ha niile ga-ejere unu ozi. Ọ bụ ezie na m tikpọrọ gị nʼiwe m, ma site nʼamara m, aga m emere gị ebere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 60:10
20 Iomraidhean Croise  

Gi onwe-gi gēbili, nwe obi-ebere n'aru Zaion: N'ihi na mb͕e eruwo imere ya amara, n'ihi na mb͕e akara àkà abiawo.


N'ihi na nání otù ntabi-anya nāgabiga n'iwe-Ya; Ogologo ndu nile nāgabiga na mb͕e ihe-ayi nātọ Yautọ: N'anyasi ikwa-ákwá gābia inọ ọnọdu-abali, Ma n'ututu iti-nkpu-ọṅù gādi.


I gāsi kwa n'ubọchi ahu, M'gēkele Gi, Jehova; N'ihi na ọ bu ezie na I wesaram iwe, ma iwe-Gi alaghachiwo azu, I we kasiem obi.


Ndi-eze gābu kwa nna nāzù umu-gi, ndi-eze-nwanyi-ha gābu kwa ndinyom nēnye umu-gi ara: ha gākpọ isi ala nye gi, kpue iru-ha n'ala, racha ájá ukwu-gi abua; i we mara na Mu onwem bu Jehova, Onye ihere agaghi-eme ndi nēle anyam.


Umu ala ọzọ kwa, ndi nārapara Jehova, ijere Ya ozi, na ihu aha Jehova n'anya, na iburu Ya ndi-orù, onye ọ bula nke nēdebe ubọchi-izu-ike ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ, nke nējidesi kwa ọb͕ub͕a-ndum ike;


Mba nile gējeru kwa ìhè-gi, ndi-eze ejerue onwu-maramara nke ọwuwa-gi.


ikpọsa arọ mb͕e ihe madu nātọ Jehova utọ, na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ Chineke-ayi nwere; ikasi ndi nile nēru újú obi;


Ndi ala ọzọ gēguzo nāzù ìgwè ewu na aturu-unu, umu ala ọzọ gābu kwa ndi-ọlu-ubi-unu na ndi-ọlu-ubi-vine-unu.


Jehova, ewela iwe nke-uku, echeta-kwa-la ajọ omume rue mb͕e ebighi-ebi: le, biko, legide anya, ndi-Gi ka ayi nile bu.


Ọ bu kwa ufọdu nime ha ka M'gēwere ibu ndi-nchu-àjà na ibu ndi Livai, ka Jehova siri.


Jehova we kwo ekworo ala-Ya, nwe ọmiko n'aru ndi-Ya.


Ndi nọ n'ebe di anya gābia kwa, wue n'ulo uku Jehova, unu ewe mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute unu. Ọ gēme kwa, ọ buru na unu ege olu Jehova, bú Chinek-unu, nti nke-ọma.


Mba nile gēwere kwa ìhè-ya jegharia: ndi-eze nke uwa nēwebata kwa ebube-ha nime ya.


ha gēwebata kwa ebube na nsọpuru nke mba nile nime ya:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan