Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 6:10 - Bible Nso

10 Me ka obi ndi nka ma abuba, me kwa ka nti-ha di arọ́, techi kwa anya-ha; ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, ghara kwa iwere obi-ha ghọta, ghara kwa ichighari, ka aghara kwa ime ka aru di ha ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Mee ka obi ndị a maa abụba, dịkwa arọ, mee ka ntị ha kpọchie, mechiekwa anya ha. Ma ọ bụghị otu a, ha nwere ike iji anya ha hụ ụzọ, jiri ntị ha nụ ihe, jirikwa obi ha ghọta, ma chigharịa bụrụ ndị a gwọrọ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 6:10
34 Iomraidhean Croise  

Obi-ha bu nání abuba dika abuba; Ma mu onwem, ihe iwu-Gi nātọm utọ nke-uku.


Ha ekpuchiwo obi-ha mara abuba: Ha ejiwo ọnu-ha kwue okwu nime npako.


Me ka anya-ha b͕a ọchichiri, ka ha we ghara ihu uzọ; Me kwa ka úkwù-ha nāma jijiji mb͕e nile.


Ma Jehova mere ka obi Fero di ike, o kweghi kwa izipu ha.


Moses na Eron we me ihe-ebube ndia nile n'iru Fero: ma Jehova mere ka obi Fero di ike, o zipughi kwa umu Israel n'ala-ya.


Ma Mu onwem, le, M'nēme ka obi ndi Ijipt di ike, ha gēso kwa ha n'azu ba: agāsọ-purukwam n'aru Fero, na n'aru usu-ndi-agha-ya nile, n'aru ub͕ọ-ala-ya nile, na n'aru ndi-inyinya-ya.


Ma Mu onwem gēme ka obi Fero sie ike, M'gēme kwa ka ihe-iriba-amam na ihe-ebubem di ọtutu n'ala Ijipt.


Onye nātachi anya-ya abua ichè èchìchè ib͕akuta Chineke azu, Onye nātabi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua, o mezuwo ihe ọjọ.


mb͕e ib͕u eb͕u, na mb͕e igwọ ọria; mb͕e itikpọ etikpọ, na mb͕e iwu ulo;


Jehova gēti kwa Ijipt ihe, nēti, nāgwọ kwa; ha gālaghachikute kwa Jehova, O we kwe ka ha riọta ihe ha nāriọ, Ọ gēme kwa ka aru di ha nma.


Okwu Jehova gābu-kwa-ra ha ihe enyere n'iwu tukwasi ihe enyere n'iwu, ihe enyere n'iwu tukwasi ihe enyere n'iwu; usoro tukwasi usoro, usoro tukwasi usoro; nwantī ebe a, nwantī ebe ahu; ka ha we je, su ngọngọ da n'azu, ewe tijie ha, ha ama n'ọnyà, ejide ha.


N'ihi na Jehova awukwasiwo unu mọ nke oké ura, we mechisie anya-unu ike, bú ndi-amuma; isi-unu, bú ndi-ọhù, ka O kpuchiwo-kwa-ra.


n'ihi nka, le, M'gaje ilu kwa oké ọlu ọzọ n'etiti ndi nka, bú oké ọlu na ọlu ebube: amam-ihe nke ndi-ha mara ihe gāla kwa n'iyì, nghọta nke ndi-nghọta-ha gēzobe kwa onwe-ya.


Ka ọ b͕agwoju unu anya, ka o ju kwa unu anya; techienu anya-unu, ka etechi kwa anya-unu: ha aṅubigawo manya ókè, ma ọ bughi manya ka ha ṅubigara ókè; ha aṅaghariwo, ma ọ bughi ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya.


Ha amaghi, ha adighi-aghọta kwa: n'ihi na O techiwo anya-ha, ha we ghara ihu uzọ; O techiwo obi-ha, ha we ghara inwe uche.


Jehova, n'ìhi gini ka I nēme ka ayi si n'uzọ-Gi nile kpafue? n'ìhi gini ka I nēme ka obi-ayi si n'egwu-Gi sie ike? Lata n'ihi ndi-orù-Gi, bú ebo nile nke ihe-nketa-Gi.


Obi di aghughọ kari ihe nile, ihe nādighi ngwọta ka ọ bu kwa: ònye gāmara ya?


Biko, nurunu nka, unu ndi di nzuzu, nke obi amam-ihe nādighi; anya abua ka ha nwere, ma ha adighi-ahu uzọ; nti abua ka ha nwere, ma ha adighi-anu ihe:


Ònye ka M'gāgwa okwu, b͕a kwa àmà, ka ha we nu? le, ihe anēbighi ùgwù ka nti-ha bu, ha apughi kwa iṅa nti: le, okwu Jehova aghọworo ha ihe-ita-uta; ọ dighi-atọ ha utọ.


I gēnye ha ihe-nkpudo obi, bú ọb͕ub͕a-iyi I b͕ara ha.


Jehova we sim, Were kwa n'onwe-gi ọzọ ihe nke onye-ọzùzù-aturu nke b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya.


Ha we ju iṅa nti, wezuga ubu-ha, me ka nti-ha di arọ́, ka ha we ghara inu ihe.


N'ihi na obi ndi nka mara abuba, Nti-ha kpọchi-kwa-ra, Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya, Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, Ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.


O mewo ka anya-ha kpue ìsì, O me-kwa-ra ka obi-ha me etili; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.


N'ihi na obi ndi nka mara abuba, Nti-ha kpọchi-kwa-ra, Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya, Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, Ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.


Ya mere chègharianu, chighari-kwa-nu, ka ewe hichapu nmehie nile unu, ka oge inwe ume ndu we si n'iru Onye-nwe-ayi bia otù a;


n'ebe ndia nọ ọ bu isìsì nke sitere n'ọnwu we dubà n'ọnwu; n'ebe ndi ahu anāzọputa nọ ọ bu isìsì nke sitere na ndu we dubà na ndu. Ma ònye ruru ime ihe ndia?


Ma Saihon, bú eze Heshbon, achọghi ka ayi gabiga n'ala-ya: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, mere mọ-ya ka ọ di ike, b͕a kwa obi-ya ume, ka O we nye ya n'aka-gi, otú ọ di ta.


ọnwunwa uku nile nke anya-gi huru, ihe-iriba-ama nile, na ihe-ebube uku ahu nile:


ma Jehova enyeghi unu obi imara ama, na anya ihu ahu, na nti inu anu, rue ta.


N'ihi na mb͕e M'gēmewori ka ha ba n'ala ahu nke M'ṅuru ndi bu nna-ha iyi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya; mb͕e ha gēriwo-kwa-ri ihe, afọ eju kwa ha, ha we ma abuba; ha gēche kwa chi ọzọ iru, fè ha òfùfè, we leliam anya, mebi kwa ọb͕ub͕a-ndum.


Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu: I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi: O we rapu Chineke nke mere ya, We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan