Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 59:9 - Bible Nso

9 N'ihi ya ikpé nke ziri ezi adiwo anya n'ebe ayi nọ, ezi omume adighi-eru kwa ayi aru: ayi nēle anya ìhè, ma le, ọ bu ọchichiri; ayi nēle anya onwunwu-ọku, ma ọ bu n'oké ọchichiri ka ayi nējeghari.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ya mere ikpe ziri ezi dị anya nʼebe anyị nọ, ezi omume adịghị erute anyị nso. Anyị na-ele anya ìhè, ma lee, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ. Anyị na-ele anya mmụke ìhè ma anyị na-ejegharị nʼime oke ọchịchịrị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 59:9
21 Iomraidhean Croise  

Ọ b͕achiwo okporo-uzọm, m'gaghi-agabiga kwa, N'uzọm nile ka Ọ nēdokwasi kwa ọchichiri.


Mb͕e m'lere anya ezi ihe, ihe ọjọ bia-kwa-ra; M'we chere ìhè, ma ọchichiri biara.


Ha amaghi, ha aghọtaghi kwa; N'ọchichiri ka ha nējeghari: Ewezugawo ntọ-ala nile nke uwa n'ọnọdu-ha.


Uzọ ndi nēmebi iwu di ka ọchichiri: Ha amaghi ihe ọ bu ha ji asu ngọngọ.


Ha gēbib͕ọ kwa megide ya n'ubọchi ahu dika nbib͕ọ nke oké osimiri: asi kwa na madu elegide ala anya, le, ọchichiri di; nkpà na ìhè; ọ b͕awo ọchichiri n'igwe-oji-ya nile.


Ayi nāb͕ọ uja dika bear, ayi nile, ọ bu kwa dika nduru ka ayi nēkwosi ákwá ike: ayi nēle anya ikpé ziri ezi, ma ọ digh: ayi nēle anya nzọputa, ma ọ di anya n'ebe ayi nọ.


Emewo kwa ka ikpe ziri ezi laghachi azu, ezi omume nēguzo kwa n'ebe di anya: n'ihi na ezi-okwu asuwo ngọngọ n'amá, izi-ezi apughi kwa ibata.


Uzọ udo ka ha nāmaghi; ọ dighi kwa ikpé ziri ezi di n'uzọ nile ha: ha emewo ka okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ha ab͕agọ; onye ọ bula nke nāzọ ije na ya adighi-ama udo.


Ha gāgabiga kwa n'etiti ya, na nkpà na agu: ọ gēru kwa, mb͕e agu nāgu ha, na ha gākpasu onwe-ha iwe, ji eze-ha, ji kwa Chineke-ha, kọcha nkọcha, ha gēche iru n'elu:


ala ka ha gēlegide kwa anya, ma, le, ahuhu na ọchichiri, bú nb͕achi nke nkpà; ọ bu kwa oké ọchichiri ka aganēnupu ha bà.


Nyenu Jehova, bú Chineke-unu, nsọpuru, tutu O me ka ọchichiri b͕a, na tutu ukwu-unu akpọbì ukwu n'elu ugwu chi-ojiji; unu we le anya ìhè, ma O mewo ya ka ọ ghọ onyinyo ọnwu, O mewo kwa ka ọ b͕a oké ọchichiri.


Ì jusiwo Juda? ọ̀ bu Zaion ka nkpuru-obi-Gi sọworo oyi? gini mere I ji tib͕u ayi, ma ọ dighi ọgwugwọ diri ayi? Ayi lere anya udo, ma ọ dighi ezi ihe biara; ayi lere anya mb͕e ọgwugwo, ma, le, oké egwu!


Ayi lere anya udo, ma ọ dighi ezi ihe biara; ayi lere anya mb͕e ọgwugwọ, ma le, oké egwu.


Mu ka O duworo me ka m'jegharia n'ọchichiri ghara inwe ìhè.


Ha aṅaghariwo dika ndi-ìsì n'èzí nile, ejiwo ọbara meru ha, Madu we ghara inwe ike imetu uwe-ha aka.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), na M'gēme ka anyanwu da n'etiti-ehihie, M'gēme kwa ka uwa b͕a ọchichiri mb͕e chi bọchara abọcha.


N'ihi na nwanyi bi na Marot echerewo inwe ezi ihe: n'ihi na ihe ọjọ esiwo n'ebe Jehova nọ ridarue ọnu-uzọ-ama Jerusalem.


Gi onye anya-Gi abua di ọcha kari ihu ihe ọjọ, Onye nāpughi kwa ilegide nmeb͕u anya, n'ìhi gini ka I nēlegide ndi nāghọb͕u aghọb͕u? n'ìhi gini ka I nāb͕a nkiti mb͕e onye nēmebi iwu nēloda onye di ezi omume kari ya;


Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan