Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 59:2 - Bible Nso

2 kama ajọ omume nile unu aghọwo ihe nākpa ókè n'etiti unu na Chineke-unu, nmehie nile unu ezonariwo kwa unu iru-Ya, O we ghara inu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Kama mmehie unu ekewapụla unu site nʼebe Chineke unu nọ; mmehie niile unu ezokwala ihu ya site nʼebe unu nọ, nke mere na ọ chọkwaghị ige ntị ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 59:2
14 Iomraidhean Croise  

Jehova di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ: Ma ekpere ndi ezi omume ka Ọ nānu.


Ọzọ, mb͕e unu nāb͕asa ọbu-aka-unu abua, M'gēzonari unu anyam abua: ọbuná mb͕e unu nēkpe ọtutu ekpere, M'gaghi-adi nānu: aka-unu juputara n'ọbara.


Otú a ka Jehova siri, Òle ebe akwukwọ nkwa nke nne-unu di, bú nke M'ji chupu ya? ma-ọbu ònye nime ndi M'nara ego n'ọmuru-nwa ka M'reworo unu n'aka ya? Le, ọ bu n'ihi ajọ omume nile nke unu ka erere unu, ọ bu kwa n'ihi njehie nile nke unu ka achupuru nne-unu.


N'ihi ajọ omume nke urù-ya ka M'were iwe, we tie ya ihe, nēzobe irum nēwe kwa iwe: o we nāga nēchighari azu n'uzọ nke obi-ya.


Le, ọ bu n'ihi ise-okwu na ilu-ọ̀gù ka unu nēbu ọnu, ya na iwere ọkpọ nke nmebi-iwu tib͕ue: unu adighi-ebu ọnu dika ta ime ka anuru olu-unu n'elu.


Ajọ omume nile unu ewezugawo ihe ndia, nmehie nile unu eb͕ochiwo-kwa-ra unu ezi ihe.


Jerusalem emehiewo nke-uku; n'ihi nka ka ọ ghọworo ihe ruru árú: Ndi nile ndi nāsọpuru ya-ri elelìwo ya anya, n'ihi na ha ahuwo ọtọ-ya: E, ya onwe-ya ezewo ume, we chigharia azu.


M'gaghi-ezonari kwa ha irum ọzọ: n'ihi na awukwasiwom Mọm n'ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Mb͕e ahu ka ha gētiku Jehova nkpu, ma Ọ gaghi-aza ha: Ọ gēzonari kwa ha iru-Ya na mb͕e ahu, dika ha meworo ka omume nile ha jọ njọ.


Israel emehiewo; ọzọ kwa, ha agabigawo ọb͕ub͕a-ndum nke M'nyere ha n'iwu: ọzọ kwa, ha ewerewo ufọdu nime ihe ewezugara nyem; ọzọ kwa, ha ezuwo ori, ọzọ kwa, ha aghọwo aghughọ, ọzọ kwa, ha etiyewo ya n'ihe-ha.


Ndi Israel we ba n'ọmuma-ulo-ikwū, ndi-okenye Israel we si, N'ìhi gini ka Jehova tib͕uworo ayi ta n'iru ndi Filistia? Ka ayi si na Shailo wetara onwe-ayi ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ka o we bata n'etiti ayi, zọputa ayi n'ọbu-aka ndi-iro-ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan