Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 59:1 - Bible Nso

1 Le, aka Jehova adighi nkpunkpu kari izọputa; nti-Ya adighi kwa arọ́ kari inu ihe:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Nʼezie, aka Onyenwe anyị adịghị mkpụmkpụ nke na o nweghị ike ịzọpụta, ntị ya adịghịkwa arọ nke na o nweghị ike ịnụ ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 59:1
17 Iomraidhean Croise  

Ọ̀ di ihe kariri Jehova ime? Na mb͕e akara àkà ka M'gēchigharikute gi, dika mb͕e a aka-nile, Sera gēnwe kwa nwa-nwoke.


Onye nāku nti dika ihe-ọkukú, Ọ̀ gaghi-anu íhe? Ma-ọbu Onye nākpu anya, Ọ̀ gaghi-ahuwa uzọ?


Otú a ka Jehova siri, Òle ebe akwukwọ nkwa nke nne-unu di, bú nke M'ji chupu ya? ma-ọbu ònye nime ndi M'nara ego n'ọmuru-nwa ka M'reworo unu n'aka ya? Le, ọ bu n'ihi ajọ omume nile nke unu ka erere unu, ọ bu kwa n'ihi njehie nile nke unu ka achupuru nne-unu.


Gini mere onye ọ bula adighi mb͕e M'biara? gini mere onye-ọziza adighi mb͕e M'kpọrọ òkù? ọ̀ bu na akam dikara nkpunkpu ma-ọli ib͕aputa? ma-ọbu ọ̀ dighi ike di nimem inaputa? Le, n'ibasi-nba-ikem anameme ka oké osimiri tasia, anameme osimiri ka ha ghọ ọzara: azù-ha nēsì ísì, n'ihi na miri adighi, we nwua n'akpiri-ikpọ-nku.


Mb͕e ahu ka i gākpọ òkù, Jehova gāza kwa; i gētiku Ya, Ọ gāsi kwa, Lekwam. Ọ buru na i si n'etiti gi wezuga yoke ahu, na nsetipu nkpisi-aka, na ikwu ajọ ihe;


Me ka obi ndi nka ma abuba, me kwa ka nti-ha di arọ́, techi kwa anya-ha; ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, ghara kwa iwere obi-ha ghọta, ghara kwa ichighari, ka aghara kwa ime ka aru di ha ike.


Ònye bu nka nēsi n'Edom bia, yiri uwe nācha ọbara-ọbara site na Bọzra? Ònye a nke mara nma n'uwe-oyiyi-Ya, nāzọ ije n'iba-uba nke ike-Ya? Ọ bu Mu onwem nke nēkwu okwu n'ezi omume, di ike izọputa.


O gēru kwa na, tutu ha akpọ, Mu onwem gāza; mb͕e ha onwe-ha nọ nēkwu okwu, Mu onwem gānu.


N'ìhi gini ka I di ka onye ihe b͕agwojuworo anya, dika dike nāpughi izọputa? ma Gi onwe-gi nọ n'etiti ayi, Jehova, ọ bu kwa aha-Gi ka akpọkwasiworo ayi; arapula ayi.


Ewo, Onye-nwe-ayi Jehova! le, Gi onwe-gi emewo elu-igwe na uwa site n'ike uku Gi na site n'ogwe-aka-Gi eseteri eseti: ọ dighi ihe ọ bula kariri Gi ime:


Ma Mu onwem gēmeso kwa ha n'ọnuma: anyam agaghi-enwe ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko: ọ buru kwa na ha akpọ nkpu na ntim abua n'oké olu, ma M'gaghi-anu olu-ha.


Gi ulo Jekob, àgāsi, Mọ nke Jehova, Ọ̀ rapuru ibu onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ? ihe ndia, hà bu omume-Ya? okwum nile, hà adighi-eme onye nējeghari n'ezi nma?


Jehova we si Moses, Aka Jehova, ọ̀ ghọwo nkpunkpu aka? ub͕u a ka i gāhu ma okwum gērere gi ma-ọbu na ọ gaghi-ere.


N'ihi na obi ndi nka mara abuba, Nti-ha kpọchi-kwa-ra, Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya, Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, Ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.


O site-kwa-ra na nka pu izọputachasi ndi nēsite n'aka Ya abiakute Chineke, ebe Ọ nādi ndu mb͕e nile iriọ aririọ n'ihi ha.


Ndi Israel we ba n'ọmuma-ulo-ikwū, ndi-okenye Israel we si, N'ìhi gini ka Jehova tib͕uworo ayi ta n'iru ndi Filistia? Ka ayi si na Shailo wetara onwe-ayi ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ka o we bata n'etiti ayi, zọputa ayi n'ọbu-aka ndi-iro-ayi.


Unu gēti kwa nkpu n'ubọchi ahu n'ihi eze-unu nke unu rọputara onwe-unu; ma Jehova agaghi-aza unu n'ubọchi ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan