Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 58:6 - Bible Nso

6 Ọ̀ bughi nka bu obubu-ọnu M'nārọputa? itọpu ab͕u nile nke nmebi-iwu, itọsa ihe-ọkiké nile nke yoke, na izilaga ndi anēmeb͕u emeb͕u ka ha nwere onwe-ha, ka unu tiji kwa yoke ọ bula?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 “Nke a ọ bụghị ụdị obubu ọnụ m họpụtara: Ịtọpụ agbụ niile nke ikpe na-ezighị ezi, na ịtọpụ ụdọ niile nke mmegbu, na ime ka ndị a na-emegbu nwere onwe ha na itiji yoku ọbụla?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 58:6
18 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a nnam boro unu yoke di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.


Ma ub͕u a nurunum, zighachi ndọta-n'agha ahu, nke unu dọtara n'agha site n'umu-nne-unu: n'ihi na iwe di ọku nke Jehova di n'aru unu.


Naputa ndi anāchigara ọnwu, Ndi ahu kwa anēwezuga n'ọnọdu-ha nye n'ob͕ub͕u, gi lezie anya ka i b͕ochie ha.


mutanu ime ezi ihe; chọnu ikpé ziri ezi, menu ka onye nēme ihe-ike gazi agazi, kpenu nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi, kpenu ọnu nwayi di-ya nwuru.


Ọ bu onye nējeghari n'ezi omume nile, nke nēkwu kwa okwu nile ziri ezi; nke nāju urù nmeb͕u nile, nke nētichapu ọbu-aka-ya abua n'ijide ihe-iri-ngo, nke nākwuchi nti-ya abua ka ọ ghara inu okwu bayere iwusi ọbara, nke nātachi kwa anya-ya abua ka ọ ghara ilekwasi ihe ọjọ anya;


onye nēmebi iwu, ya rapu uzọ-ya, onye nēme ajọ ihe, ya rapu èchìchè-ya nile: ya laghachikute kwa Jehova, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru ya; ya laghachikute kwa Chineke-ayi, n'ihi na Ọ gāb͕aghara ya nmehie-ya n'uba.


Mb͕e ahu ka i gākpọ òkù, Jehova gāza kwa; i gētiku Ya, Ọ gāsi kwa, Lekwam. Ọ buru na i si n'etiti gi wezuga yoke ahu, na nsetipu nkpisi-aka, na ikwu ajọ ihe;


Otú a ka Jehova siri: Menu ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, naputa-kwa-nu onye anapuworo ihe n'ike n'aka onye-nmeb͕u: unu emejọ-kwa-la ọbìa, ma-ọbu nwa-nb͕ei, ma-ọbu nwanyi di-ya nwuru, unu emela ha ihe-ike, unu awusi-kwa-la ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ebe a.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ndi emeb͕uru emeb͕u ka umu Israel na umu Juda bu n'otù: ndi nile dọtaworo ha n'agha ejidesiwo ha ike; ha ajuwo izilaga ha.


N'ihi nka, eze, kwe ka ndum-ọdum di gi nma n'anya, were kwa ezi omume tijipu nmehie-gi nile, were kwa imere ndi ewedara n'ala amara tijipu ajọ omume-gi nile; asi na ogologo mb͕e gādiri udo-gi.


ma-ọbu ihe ọ bula nke ọ ṅuru iyi bayere ya n'ugha; o gākwughachi kwa ya na nkwuzu-ya, ọ bu kwa otù uzọ n'uzọ ise ka ọ gātukwasi ya: ọ bu onye nwe ihe ahu ka ọ gēnye ya, n'ubọchi àjà-ikpe-ọmuma-ya.


ma ka ha kpuchie onwe-ha n'ákwà-nkpe, ma madu ma anumanu, ka ha kpọkusi kwa Chineke ike: ka ha chighari kwa, onye ọ bula ya pua n'uzọ ọjọ ya, na n'ihe-ike nke di n'ọbu-aka-ha.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Kpenu ikpe ezi-okwu, nwe-kwa-nu ebere na obi-ebere nile, onye ọ bula n'aru nwa-nne-ya:


N'ihi na ahurum na i nọ n'òlùlù ilu na ab͕u nke ajọ omume.


Ka ha ra, bú ndi-orù nke nọ n'okpuru yoke, ha gua ndi-nwe-ha na ndi kwesiri nsọpuru nile, ka ewe ghara ikwulu aha Chineke na ozizí-ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan