Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 58:1 - Bible Nso

1 Were akpiri kpọ nkpu, eb͕ochila, welie olu-gi dika opì-ike, we gosi ndim njehie-ha, gosi kwa ulo Jekob nmehie-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 “Welie olu gị tie mkpu, egbochikwala iti mkpu. Welie olu gị dịka opi ike. Gwa ndị m nnupu isi ha, gwakwa ụlọ Jekọb mmehie ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 58:1
37 Iomraidhean Croise  

Ulo Jekob, bianu, ka ayi jegharia n'ìhè Jehova.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na agāfù opì-ike uku; ha gābia kwa, bú ndi nāla n'iyì n'ala Asiria, na ndi achusara achusa n'ala Ijipt; ha gākpọkwa isi ala nye Jehova n'ugwu nsọ ahu nime Jerusalem.


Ọ bu olu onye nāsi, Kpọ nkpu. Otù onye we si, Gini ka m'ganākpọ nkpu? Anu-aru nile bu ahihia, ima-nma-ya nile di kwa ka okoko ọhia:


Nna-gi mbu mehiere, ndi-nsughari-gi ejehiewo kwa megidem.


Otú a ka Jehova siri, Òle ebe akwukwọ nkwa nke nne-unu di, bú nke M'ji chupu ya? ma-ọbu ònye nime ndi M'nara ego n'ọmuru-nwa ka M'reworo unu n'aka ya? Le, ọ bu n'ihi ajọ omume nile nke unu ka erere unu, ọ bu kwa n'ihi njehie nile nke unu ka achupuru nne-unu.


Ndi-nche-ya bu ndi-ìsì, ha nile amaghi ama; ha nile bu nkita dara ob͕i, ha apughi ib͕ọ uja; ha bu ndi nārọ nrọ, nēdina ala, nāhu itu-òrù-ura n'anya.


Mu onwem gēgosi ezi omume-gi; ma ọlu-gi nile, ha agaghi-abara gi urù.


N'ihi na njehie-ayi bara uba n'iru Gi, nmehie nile nke ayi azawo kwa megide ayi: n'ihi na ayi na njehie nile ayi nọkọ n'otù; ọzọ, ajọ omume nile ayi, ayi mara ha:


Je, kpọ òkù na nti nke Jerusalem, si, Otú a ka Jehova siri, Echetawom n'ebe i nọ ebere nke mb͕e i nọ na nwata, ihu-n'anya nke mb͕e aluru gi ọhu: otú i jesorom n'ọzara, n'ala anāghaghi nkpuru.


O rue, n'arọ nke-ise nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, n'ọnwa nke-iteghete, na ndi nile ndi nọ na Jerusalem, na ndi nile ndi si n'obodo nile nke Juda abata na Jerusalem, kpọsara obubu-ọnu n'iru Jehova.


Eme-kwa-ram ka ndi-nche biliere unu, si, Ṅanu nti olu opì-ike; ha we si, Ayi agaghi-aṅa nti.


Ndi-amuma-gi ahutaworo gi ọhù ihe-efu na ihe-nzuzu; Ma ha ekpugheghi ajọ omume-gi, ime ka ndi-gi adọtara n'agha lata: Kama ha ahutaworo gi ibu di iche iche nke ihe-efu na ihe-nchupu di iche iche.


N'ihi nka bue amuma megide ha, bue amuma, nwa nke madu.


Nwa nke madu, me ka Jerusalem mara ihe-árú-ya nile,


Ì gēkpe ha ikpe, nwa nke madu, ì gēkpe ha ikpe? me ka ha mara ihe-árú nile nke ndi bu nna-ha;


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, ì gēkpe ikpe, ì gēkpe obodo ọbara nka ikpe? i gēme kwa ka ọ mara ihe-árú nile ya.


Jehova we sim: Nwa nke madu, i gēkpe Ohola na Oholiba ikpe? gosi kwa ha ihe-árú nile ha.


ọ we hu mma-agha ahu ka ọ nābiakwasi ala-ya, o buru na ọ fùa opì-ike-ya, dọ ndi-ya aka na nti;


Tiye opì-ike n'okpo-ọnu-gi. Dika ugo ka ọ nābia megide ulo Jehova; n'ihi na ha agabigawo pua n'ọb͕ub͕a-ndum, ọ bu kwa iwum ka ha jehieworo megide.


Bilie, jerue Nineve, bú obodo uku, ahu, kpọsa okwu megide ya; n'ihi na ihe ọjọ ha arigotawo n'irum.


Nēkwu ihe ndia, were kwa ha nādusi ọdu ike, were kwa ha nātu madu nmehie-ha n'anya, n'inye iwu nile. Ka madu ọ bula ghara ilelì gi anya.


Emere ka m'nọ nime Mọ Nsọ n'ubọchi Onye-nwe-ayi, m'we nu otù oké olu n'azum, dika nke opì,


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, ọnu-uzọ ka o gheworo oghe n'elu-igwe, olu mbu m'nu-kwa-ra, olu dika nke opì nākpayerem uka, otù onye nāsi, Rigota n'ebe a, M'gēgosi kwa gi ihe nile nke nāghaghi iputa mb͕e ihe ndia gasiri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan