Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 57:14 - Bible Nso

14 Ọ gāsi kwa, Tulienu, tulienu, dozienu uzọ, bupunu ihe-isu-ngọngọ n'uzọ ndim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 A ga-asịkwa, “Dozienụ ụzọ! Dozienụ ụzọ, mee ya ka ọ maa mma. Bupụsịanụ ihe ịsọ ngọngọ niile nʼụzọ ndị m.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 57:14
14 Iomraidhean Croise  

Bùkuenu Chineke abù, bùkuenu aha-Ya abù ọma: Tulierenu Ya uzọ, bú Onye nānọkwasi inyinya gabiga n'ala ihe nādighi; Aha-Ya bu JA; ṅuri-kwa-nu ọṅu-agha n'iru Ya.


Uzọ atuliri atuli, ọbuná uzọ, gādi kwa n'ebe ahu, Uzọ nke idi-nsọ ka agākpọ kwa ya; onye ruru árú agaghi-agabiga na ya; ma uzọ ahu gādiri ndi ahu: onye ọ bula nke nāga n'uzọ, ọbuná ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ha agaghi-akpafu akpafu.


Ọ bu olu nke onye nākpọ nkpu n'ọzara, si, Dozienu uzọ Jehova, menu ka uzọ atuliri atuli guzoziere Chineke-ayi n'ala ihe nādighi.


M'gēme kwa ka ugwum nile ghọ uzọ, agēme kwa ka uzọm nile atuliri atuli di elu.


Gabiganu, gabiganu n'ọnu-uzọ-ama nile; dozienu uzọ ndim; tulienu, tulienu uzọ atuliri atuli; tutupunu nkume; bulienu ọkọlọtọ n'elu ndi nile di iche iche.


N'ihi na ndim echezọwom, ihe-efu ka ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nye; ha we me ka ha su ngọngọ n'uzọ nile ha, bú uzọ-ije nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, ije ije n'okporo-uzọ di iche iche, bú uzọ anātulighi atuli;


Ya mere ka ayi ghara ikperita ibe-ayi ikpé ọzọ: ma kama ya kpenu ikpé a, ka onye ọ bula ghara idebe ihe-isu-ngọngọ, ma-ọbu ọnyà, n'uzọ nwa-nna-ya.


ma ayi onwe-ayi nēkwusa Kraist, na akpọgidere Ya n'obe, Onye buru ndi-Ju ọnyà, buru kwa ndi mba ọzọ ihe-nzuzu;


N'ihi nka, ma ọ buru na ihe-oriri eme ka nwa-nnam ma n'ọnyà, m'gaghi-eri anu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ka m'ghara ime ka nwa-nnam ma n'ọnyà.


Ma lezienu anya ka ike-unu nka ghara isi n'uzọ ọ bula ghọ ihe gēme ka ndi nādighi ike su ngọngọ.


ayi adighi-eme ihe-isu-ngọngọ ọ bula n'ihe ọ bula, ka aghara ita ije-ozi-ayi uta;


kwa-kwa-ranu ukwu-unu uzọ nke nēguzozi ọtọ, ka ewe ghara ime ka ukwu nke di ngwurọ kwopu, kama ka ewe me ka ọ di ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan