Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 57:13 - Bible Nso

13 Mb͕e i nēti nkpu, ka ndi i chikọtaworo naputa gi; ma ha nile ka ifufe gēfepu, otù nku-ume gēkupu ha: ma onye ahu nke nab͕abà nimem gēketa ala, nweta kwa ugwu nsọm.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Mgbe ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ka arụsị niile ndị ịchịkọbara zọpụta gị. Ikuku ga-eburu ha niile bufuo, naanị otu nkuume ga-ekutu ha. Ma onye ọbụla gbabara nʼime m izere ndụ ga-eketa ala ahụ; ha ga-enwetakwa ugwu nsọ m.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 57:13
39 Iomraidhean Croise  

Elaisha we si eze Israel, Gini ka mu na gi nwekọrọ? jekuru ndi-amuma nna-gi, jekuru kwa ndi-amuma nne-gi. Eze Israel we si ya, É-è: n'ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndia inye ha n'aka Moab.


Ùb͕ò ole ka ha di ka ahihia-ọka n'iru ifufe, Na dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēzupu dika onye-ori?


Ọ bughi otú a ka ndi nēmebi iwu di; Kama ha di ka ib͕ob͕o-ọka nke ifufe nēfesa.


Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi madu obi.


Ndi nātukwasi Jehova obi Dika ugwu Zaion, nke anādighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya, kama rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ nādigide.


Ma ndi di ume-ala n'obi gēnweta ala; Iba-uba nke udo gātọ kwa ha utọ.


N'ihi na ndi Ọ nāgọzi gēnweta ala; Ma agēbipu ndi Ọ nākọcha.


Ndi ezi omume gēnweta ala, Biri kwa n'elu ya rue mb͕e ebighi-ebi.


Tukwasi Jehova obi, me kwa ezi ihe; Biri n'ala, nāzù kwa onwe-gi n'ikwesi-ntukwasi-obi.


Nēle anya Jehova, nēdebe kwa uzọ-Ya, Ọ gēbuli kwa gi inweta ala: Mb͕e anēbipu ndi nēmebi iwu, i gāhu.


N'ihi na agēbipu ndi nēme ihe ọjọ: Ma ndi nēle anya Jehova, ndi ahu gēnweta ala.


Tutu ite-unu amata ọku ogwu, Ma ihe di ndu ma ihe di ọku, Ọ nēfepusi ha ike dika oké ifufe.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nātukwasi obi na Gi.


Onye nkpuru-obi-ya di nganga nākpali ise-okwu: Ma onye nātukwasi Jehova obi, agēme, ya ka ọ ma abuba.


Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n'ugwu nsọm nile: n'ihi na ihe-ọmuma Jehova gējuputa uwa, dika miri si ekpuchi oké osimiri.


Gini kwa ka madu gāza ndi-ozi nke mba? Na Jehova atọwo ntọ-ala Zaion, ọ bu kwa nime ya ka ndi ewedara n'ala nke ndi-Ya gāb͕abà.


N'ihi na I buworo onye nēnweghi ike ebe siri ike, I buworo ob͕eye ebe siri ike nime nkpà nākpa ya, ebe-nb͕abà ipu n'oké miri-ozuzo, ǹdò ipu n'okpom-ọku, mb͕e oké ifufe nke ndi nēme ka madu na jijiji di ka oké miri-ozuzo nāmakwasi mb͕idi.


E, akākughi ha dika osisi: e, akāghaghi ha dika nkpuru: e, ogwe-osisi-ha akāb͕aghi nkpọrọgwu n'ala: ọzọ kwa, O kukwasiwo ha ume, ha we kpọnwua, oké ifufe nēfepu kwa ha dika ahihia-ọka kpọrọ nku.


I gāfucha ha, ifufe gēfepu kwa ha, oké ifufe gēfesa kwa ha: ma gi onwe-gi gēteghari egwú ọṅù na Jehova, n'Onye Nsọ nke Israel ka i gānya isi.


Chikọtanu onwe-unu, bia; biarunu nso n'otù, unu ndi mba nile b͕aputara ab͕aputa: ha amaghi ama, bú ndi ahu nēbu osisi arusi-ha apiri api, ndi nēkpe-kwa-ra chi nādighi-azọputa.


Otú a ka Jehova siri, Na mb͕e ihe madu nātọm utọ ka M'zaworo gi, ọ bu kwa n'ubọchi nzọputa ka M'nyeworo gi aka: M'gēchebe kwa gi, nye gi ka i buru ọb͕ub͕a-ndu nke ndim, ime ka ala bilie, ime ka ha keta ihe-nketa nile tọb͕ọrọ n'efu;


M'gēme ka ha biarue ugwu nsọm, M'gēme kwa ka ha ṅuria n'ulo-ekperem; àjà-nsure-ọku nile ha na àjà nile ha gābu ihe nātọ utọ n'elu ebe-ichu-àjàm: n'ihi na agākpọ ulom ulo ekpere diri ndi nile di iche iche.


Ndi-gi kwa, ha nile gābu ndi ezi omume, rue mb͕e ebighi-ebi ka ha gēnweta ala; alaka nke ọkukúm, ọlu akam, ime ka M'ma nma.


Ma unu onwe-unu ndi nārapu Jehova, ndi nēchezọ ugwu nsọm, ndi nēdoro Gad table n'usoro, ndi nāb͕ajuru Meni manya gwara ọgwa;


Anu-ọhia wolf na nwa-aturu gātakọ nri n'otù, ọdum gāta kwa ahihia dika ehi: ma agwọ, ájá gābu nri-ya. Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n'ugwu nsọm nile, ka Jehova siri.


M'gēme kwa otù nkpuru ka o si na Jekob puta, na otù onye-nnweta nke ugwum nile ka o si na Juda puta: ndi M'rọputaworo ewe nweta ya, ndi-orùm gēbi kwa n'ebe ahu.


Ha gēme kwa umu-nne-unu nile ka ha si na mba nile bia ibu onyinye-inata-iru-ọma enyere Jehova, n'elu inyinya, na n'ub͕ọ-ala, na n'ub͕ọ-ala nwere ihe-okpukpu, na n'elu inyinya mule, na n'elu anu di ngwa, rue ugwu nsọm, bú Jerusalém, ka Jehova siri, dika umu Israel si ewebata onyinye-inata-iru-ọma-ha n'ulo Jehova n'ihe di ọcha.


Ma òle ebe chi-gi nile nke i meworo nye onwe-gi nọ? ka ha bilie, ọ buru na ha gāzọputa gi na mb͕e ọnọdu ọjọ gi: n'ihi na dika ọnu-ọgugu obodo-gi nile si di, otú a ka chi-gi nile di, Juda.


Rigo na Lebanon, ti kwa nkpu; me kwa ka olu-gi da udà na Beshan: si kwa n'Abarim tie nkpu; n'ihi na etipiawo ndi nile nāhu gi-ri n'anya.


Ndi-ọzùzù-aturu-gi nile ka ifufe gāzù dika aturu, ndi nāhu gi n'anya gēje na ndota-n'agha: n'ezie mb͕e ahu ka ihere gēme gi, agētiye kwa gi n'ọnọdu-ihere, site n'ihe ọjọ gi nile.


Ndi nile ndi nāhu gi n'anya echezọwo gi; ha adighi-achọ gi: n'ihi na otiti nke onye-iro, bú idọ-aka-na-nti nke onye nēnweghi obi-ebere, ka M'wereworo tie gi; n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, n'ihi na nmehie-gi nile nwere ume.


N'ihi na n'ugwu nsọm, n'ugwu nke ebe di elu nke Israel, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ebe ahu ka ulo Israel nile, ka ọ ra, gēfèm n'ala-ha: n'ebe ahu ka ihe-ha gātọm utọ, ọ bu kwa n'ebe ahu ka M'gāchọ àjà-nbuli nile unu na nkpuru mbu nke ùtú nile unu, ha na ihe nsọ nile unu.


N'ihi nka ka ha gādi ka igwe-oji ututu, na dika igirigi nke nāla n'isi-ututu, dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēfechapu n'ebe-nzọcha-ọka, na dika anwuru-ọku si apu na window.


Unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Onye bi na Zaion, bú ugwu nsọm: Jerusalem ewe di nsọ, ndi ala ọzọ agaghi-agabiga kwa nime ya ọzọ.


O rue na, dika Ọ kpọrọ òkù, ma ha anughi; otú a ka ha gākpọ òkù, ma M'gaghi-anu; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri;


Jenu, tikue chi ndi unu rọputaworo; ka ha onwe-ha zọputa unu na mb͕e nkpab͕u-unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan