Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 56:4 - Bible Nso

4 N'ihi na otú a ka Jehova siri ndi-onozi ndi nēdebe ubọchi-izu-ikem nile, ndi rọputawo-kwa-ra ihe tọrọm utọ, ndi nējidesi kwa ọb͕ub͕a-ndum ike:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru: “Nye ndị onozi ahụ na-edebe ụbọchị izuike m niile, ndị na-ahọrọ ihe na-atọ m ụtọ, na ndị na-ejidesikwa ọgbụgba ndụ m ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 56:4
12 Iomraidhean Croise  

N'ihi na ọ bughi otú a ka ulom di n'ebe Chineke nọ; N'ihi na ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka Ọ b͕aworo nyem, Bú ọb͕ub͕a-ndu edoworo n'usoro n'ihe nile, nke edebewo-kwa-ra: N'ihi na nzọputam nile, na ihe-utọ nile, N'ezie Ọ gaghi-eme ka o pute.


Eketawom ihe-àmà-Gi nile rue mb͕e ebighi-ebi; N'ihi na ihe nātọ obim utọ ka ha bu.


Okporo-uzọ nile nke Jehova bu ebere na ezi-okwu N'ebe ndi nēchezi ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ihe-àmà-Ya nile nọ.


Ma-ọbu, ya jide ebem siri ike, ọ gēme ka Mu na ya di n'udo; e, ọ gēme ka Mu na ya di n'udo.


Tọnu nti-unu n'ala, biakutem; nurunu, nkpuru-obi-unu ewe di ndu: Mu na unu gāb͕a kwa ndu, bú ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, bú ebere nile kwesiri ntukwasi-obi nke emere Devid.


Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye nēme nka na nwa madu nke nējidesi ya ike bu; onye nēdebe ubọchi-izu-ike ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ, nke nēdebe kwa aka-ya ghara ime ihe ọjọ ọ bula.


Umu ala ọzọ kwa, ndi nārapara Jehova, ijere Ya ozi, na ihu aha Jehova n'anya, na iburu Ya ndi-orù, onye ọ bula nke nēdebe ubọchi-izu-ike ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ, nke nējidesi kwa ọb͕ub͕a-ndum ike;


Ọ buru na i me ka ukwu-gi si n'ubọchi-izu-ike chighari, i we ghara ime ihe nātọ gi utọ n'ubọchi nsọm; ọ buru kwa na i kpọ ubọchi-izu-ike ihe-utọ, i kpọ kwa ihe nsọ nke Jehova ihe-nsọpuru; i we sọpuru ya, ghara ime ihe bu uzọ-gi nile, ghara ichọputa ihe nātọ gi utọ ma-ọbu ikwu okwu nke aka gi:


Ha gāju ajuju uzọ isi je Zaion, nēche iru-ha n'ebe a, si, Bianu, were onwe-unu rapara n'aru Jehova n'ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi nke anāgaghi-echezọ echezọ.


ma otu ihe bu ihe di nkpà: n'ihi na Meri rọputara ezi òkè ahu, nke anāgaghi-anapu ya.


N'otù uzọ ahu Chineke, ebe Ọ nēzube igosibiga ndi-nketa nke nkwa-Ya ókè kari na izù-Ya bu ihe nādighi-agha agha, O were iṅu-iyí b͕o okwu:


Ma ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-unu ifè Jehova òfùfè, rọputaranu onwe-unu ta onye unu gēfè òfùfè; ma ọ bu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè nke di n'ofè Osimiri ahu, ma-ọbu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma mu onwem na ulom, ayi gēfè Jehova òfùfè.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan