Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 56:3 - Bible Nso

3 Ka nwa ala ọzọ nke raparaworo na Jehova ghara ikwu okwu, si, Jehova aghaghi ikewapum na ndi-Ya: ka onozi ghara kwa isi, Le, mu onwem bu osisi kpọnwuru akponwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ka onye ala ọzọ bụ onye jikọrọ onwe ya na Onyenwe anyị sị, “Onyenwe anyị aghaghị i site na ndị ya kewapụ m.” Ka onye onozi ọbụla gharakwa ị sị “Mụ onwe m bụ naanị osisi kpọnwụrụ akpọnwụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 56:3
35 Iomraidhean Croise  

Ọzọ kwa, ihe bayere onye ala ọzọ, nke ọ bughi na ndi-Gi, bú Israel, ka o sitere, ma o siwo n'ala di anya bia n'ihi aha uku Gi, na aka-Gi di ike, na ogwe-aka-Gi esetiri eseti; mb͕e ha gābia kpe ekpere n'ebe ulo a di:


n'ihi nka ka ndi-Ju mere ka o guzosie ike, ha we nara ihe a bayere onwe-ha, baye-kwa-ra nkpuru-ha, baye-kwa-ra ndi nile ndi nārapara n'aru-ha, ka o we ghara igabiga, bú na ha ganēme ememe n'ubọchi abua ndia dika odide-akwukwọ-ha si di, na dika mb͕e-ha ezubere ezube si di, n'arọ nile ọ bula;


N'ihi na Jehova gēnwe obi-ebere n'aru Jekob, Ọ gārọputa kwa Israel ọzọ, do ha n'ala-ha: ọbìa gārapara kwa n'aru ha, ha gēme kwa onwe-ha ka ha na ulo Jekob dikọ n'otù.


Ufọdu kwa nime umu-gi ndikom, ndi gēsi n'aru-gi puta, ndi i gāmuta, ha gāchiri ha; ha gābu kwa ndi-onozi n'ulọ uku eze Babilon.


M'gēnye, ha n'ulom na nime mb͕idim nile ihe-ncheta na aha di nma kari umu-ndikom, kari kwa umu-ndinyom; aha ebighi-ebi ka M'gēnye ha n'otù n'otù, nke anāgaghi-ebipu.


Umu ala ọzọ kwa, ndi nārapara Jehova, ijere Ya ozi, na ihu aha Jehova n'anya, na iburu Ya ndi-orù, onye ọ bula nke nēdebe ubọchi-izu-ike ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ, nke nējidesi kwa ọb͕ub͕a-ndum ike;


Ha gāju ajuju uzọ isi je Zaion, nēche iru-ha n'ebe a, si, Bianu, were onwe-unu rapara n'aru Jehova n'ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi nke anāgaghi-echezọ echezọ.


ma-ọbu onye-nkpunkpu-azu, ma-ọbu onye-ùkpọ̀, ma-ọbu nke nwere ntupọ n'anya-ya, ma-ọbu nke àb͕à nāta, ma-ọbu nke nwere ire-ebube, ma-ọbu nke nkpuru-amu-ya chipiara echipia;


Ọzọ kwa, ufọdu nime umu ndi-nnọdu ndi nọ dika ọbìa n'ala-unu, ufọdu nime ha ka unu gāb͕ata, na ufọdu nime ab͕uru-ha ndi nọ n'ala-unu ndi ha muru n'ala-unu: ha gābu-kwa-ra unu ihe-onwunwe.


Onye di egwu ka Jehova gābu n'imegide ha: n'ihi na Ọ gēme ka chi nile nke uwa ta aru; madu gākpọ kwa isi ala nye Ya, onye ọ bula site n'ọnọdu-ya, bú agwe-etiti nile nke mba nile.


Ha gārapara kwa n'aru-gi, debe kwa ihe-ndebe nke ulo-ikwū nzute, nke diri òfùfè nile nke Ulo-ikwū ahu: ma onye ala ọzọ agaghi-abiaru nso unu.


Ma gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi gēdebe ọlu-nchu-àjà-unu bayere ihe nile nke ebe-ichu-àjàm, baye-kwa-ra ihe di nime ákwà-nb͕ochi; unu gēfè kwa: dika òfùfè nke onyinye ka M'nēnye unu ọlu-nchu-àjà-unu: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.


Pita we saghe ọnu-ya, si, N'ezie anamaghọta na Chineke abughi onye nēle madu anya n'iru:


Ewe me ka ufọdu nime ha kweye, ha we dayere Pọl na Sailas; ha na oké ìgwè madu n'etiti ndi-Grik ndi nātu egwu Chineke, ọ dighi kwa ndinyom ole-na-ole nime ndinyom ndi bu ndi-isi dayere ha.


O we si n'ebe ahu pua, ba n'ulo otù onye, aha-ya bu Taitọs Justọs, onye nāsọpuru Chineke, onye ulo-ya di ulo-nzukọ, ahu ezi nso.


ka m'we buru onye nēfè Kraist Jisus òfùfè ijekuru ndi mba ọzọ, nālu kwa ọlu onye-nchu-àjà nke ozi ọma Chineke, ka ewe me ka iche-ndi-mba-ọzọ-n'iru-Chineke buru ihe agānara nke-ọma, ebe edoro ya nsọ nime Mọ Nsọ.


Ma onye nārapara n'aru Onye-nwe-ayi, ya na Ya bu otù mọ.


na unu guzoro iche n'ebe Kraist nọ n'oge ahu, ndi emereri ka unu buru ndi ala ọzọ n'ebe ọnọdu ndi amuru ndi Israel di, unu bu kwa ndi-ọbìa n'ebe ọb͕ub͕a-ndu nile nke nkwa ahu di, ndi nēnweghi olile-anya, ndi nāmaghi kwa Chineke n'uwa.


Onye anēwukọ kwa unu onwe-unu nime Ya ka unu we buru ebe-obibi nke Chineke nime Mọ Nsọ.


Mb͕e i nāpu dika ọmuma-ulo-ikwū imegide ndi-iro-gi, i gēdebe kwa onwe-gi pua n'ihe ọjọ ọ bula.


Pita, onye-ozi nke Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi arọputaworo ndi bi dika ọbìa n'etiti Nb͕asa ahu nime Pọntọs, Galetia, Kapadọsia, Esia, na Bitinia,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan