Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 56:10 - Bible Nso

10 Ndi-nche-ya bu ndi-ìsì, ha nile amaghi ama; ha nile bu nkita dara ob͕i, ha apughi ib͕ọ uja; ha bu ndi nārọ nrọ, nēdina ala, nāhu itu-òrù-ura n'anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Nʼihi na ndị na-eche ndị m nche kpuru ìsì. Ha niile bụ ndị amamihe kọrọ. Ha dị ka nkịta dara ogbi, nke na-adịghị agbọ ụja. Ha hụrụ ịrahụ ụra na ịrọ nrọ, na idina ndina nʼanya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 56:10
24 Iomraidhean Croise  

O rue, n'arọ nke-orú-na-atọ nke eze, bú Jehoash, na ndi-nchu-àjà emeghi ka ebe etipúru etipú nke ulo ahu di ike.


N'ihi na Jehova awukwasiwo unu mọ nke oké ura, we mechisie anya-unu ike, bú ndi-amuma; isi-unu, bú ndi-ọhù, ka O kpuchiwo-kwa-ra.


Ka ọ b͕agwoju unu anya, ka o ju kwa unu anya; techienu anya-unu, ka etechi kwa anya-unu: ha aṅubigawo manya ókè, ma ọ bughi manya ka ha ṅubigara ókè; ha aṅaghariwo, ma ọ bughi ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya.


Nuru olu ndi-nche-gi! ha eweliwo olu-ha, n'otù ka ha nētikọ nkpu ọṅù; n'ihi na anya na anya ka ha gāhu mb͕e Jehova nālaghachikute Zaion.


Were akpiri kpọ nkpu, eb͕ochila, welie olu-gi dika opì-ike, we gosi ndim njehie-ha, gosi kwa ulo Jekob nmehie-ha.


Ha aṅaghariwo dika ndi-ìsì n'èzí nile, ejiwo ọbara meru ha, Madu we ghara inwe ike imetu uwe-ha aka.


bú ndi-amuma Israel ndi nēbu amuma bayere Jerusalem, ndi nāhu-kwa-ra ya ọhù udo, ma udo adighi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ma onye-nche ahu, mb͕e ọ gāhu mma-agha ahu ka ọ nābia, ma ọ fùghi opì-ike, ewe ghara idọ ndi-ya aka na nti, mma-agha ahu abia, wepu madu ọ bula n'etiti ha; onye ahu, n'ihi ajọ omume-ya ka ewepuworo ya, ma n'aka onye-nche ahu ka M'gājuta ọbara-ya.


Emewo ka ndim la n'iyì site n'enweghi ọmuma Chineke: n'ihi na gi onwe-gi ajuwo ọmuma ahu, M'gāju kwa gi, i we ghara iburum onye-nchu-àjà: i chezọwo kwa iwu nke Chineke-gi, M'gēchezọ kwa umu-gi, ọbuná Mu onwem.


Ndi-ọzùzù-aturu-gi atuwo òrù-ura, gi eze Asiria: ndi-ebube-gi nwere ebe-obibi-ha n'ájá: ndi-gi ab͕asawo n'elu ugwu nile, ọ dighi kwa onye-nchikọta ha nwere.


Rapunu ha: ha bu ndi-ndú kpuru ìsì. Ma ọ buru na onye-ìsì edu onye-ìsì, ha abua gādabà n'olùlù.


Lezienu nkita ahu nile anya, lezienu ndi-ọlu ọjọ ahu anya, lezienu obibì-aru ahu anya:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan