Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 54:1 - Bible Nso

1 Tie nkpu ọṅù, gi nwayi-àgà, bú nwayi nāmughi nwa; tiwa nkpu ọṅù, tisi kwa nkpu ike, gi onye ime nwa nēmegh: n'ihi na umu nke nwanyi arapuru nání ya di ọtutu kari umu nke nwanyi aluru na nwunye, ka Jehova siri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 “Bụọ abụ, gị nwanyị aga, gị onye na-amụtaghị nwa; tie mkpu ọṅụ, tiwakwaa olu abụ, gị onye ime nwa na-emetụbeghị; nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwanyị nwere di,” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 54:1
21 Iomraidhean Croise  

Sera we si, Ichì-ọchì ka Chineke doziworom; onye ọ bula nke nānu ya gāchì ọchì bayerem.


Ọ bu onye nēme ka nwayi-àgà nke ulo biri n'ezi-na-ulo nke aka ya, Buru nne nāṅuri ọṅu nke muworo umu-ndikom. Tonu Jehova.


Ayi nwere otù nwa-nne nwayi di ntà, Ma ọ dighi ara ọ kpuru: Gini ka ayi gēmere nwa-nne-ayi N'ubọchi mb͕e agēkwu okwu-ya?


Tisie nkpu ike, kpọ nkpu ọṅù, gi nwanyi bi na Zaion n'ihi na onye uku n'etiti gi ka Onye Nsọ nke Israel bu.


Ndi ahu gēbuli olu-ha, ha gēti nkpu ọṅù; n'ihi nbili-elu Jehova ha gēsi n'oké osimiri tisie nkpu ike.


Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe, n'ihi na Jehova emewo ya; tienu nkpu, unu ebe nile di ala nke uwa; unu ugwu, tibenu nkpu ọṅù, gi oké ọhia, na osisi ọ bula di nime ya: n'ihi na Jehova ab͕aputawo Jekob, ọ bu kwa n'Israel ka Ọ gēme Onwe-ya ka Ọ ma nma.


Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe; tegharia egwú ọṅù, gi uwa; tiwanu nkpu ọṅù, unu ugwu: n'ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru ndi-Ya ewedara n'ala.


N'ihi na, nkpọnkpọ ebe-gi nile na ebe-gi nile tọb͕ọrọ n'efu na ala-gi akwadara akwada, n'ezie ub͕u a i gādikara ndi bi n'ala nkpà, ndi nēloda gi gānọ kwa n'ebe di anya.


Umu nke mb͕e ọb͕ub͕a-aka-umu-gi gāsi kwa na nti-gi abua ọzọ, Ebe a dim nkpà: nyem ọnọdu ka m'we biri.


Agaghi-agu kwa gi aha Nwanyi arapuru arapu ọzọ; agaghi-agukwa ala-gi aha Ala tọb͕ọrọ n'efu ọzọ: n'ihi na gi ka agākpọ Hefzi-ba, agākpọ kwa ala-gi Beula: n'ihi na ihe-gi nātọ Jehova utọ, agālu kwa ala-gi dika nwunye.


Tutu ime eme ya, ọ muru nwa; tutu ihe-nb͕u nke diri ya abia, ọ muputara nwa-nwoke.


Tie nkpu ọṅù, gi ada Zaion; tie nkpu, gi Israel; ṅuria, were obi nile ṅuria ọṅu-agha, gi ada Jerusalem.


Tegharia egwú ọṅù nke-uku, gi ada Zaion; tie nkpu, gi ada Jerusalem: le, eze-gi nābiakute gi: onye ezi-omume na onye nwere nzọputa ka ọ bu; onye ewedara n'ala, nke nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu, ọbuná na nwa-inyinya, bú nwa-inyinya-ibu.


N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ka obi nātọ gi utọ, nwanyi-àgà nke nādighi-amu nwa; Tiwa nkpu ọṅù, ti kwa nkpu, gi onye ime nādighi-eme: N'ihi na umu nke nwanyi arapuru nání ya di ọtutu kari umu nke nwanyi ahu nwere di.


Ndi afọ juru emewo onwe-ha ndi egoro ọlu n'ihi nri; Ma agu agubìwo ndi ọ nāgu: Ebe nwanyi àgà muworo umu asa; Ma nwanyi nke nwere ọtutu umu atawo aru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan