Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 53:7 - Bible Nso

7 Achiri ya n'ihe-ike, ma ya onwe-ya wedara onwe-ya n'ala, we ghara isaghe ọnu-ya; dika aturu nke anākpuru ije n'ob͕ub͕u-ya, na dika nne-aturu nke dara ob͕i n'iru ndi nākpacha ya aji; e, ọ dighi-asaghe ọnu-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 A kpagburu ya, mesie ya ihe ike, ma otu mkpụrụ okwu esighị ya nʼọnụ pụta. E duuru ya pụọ dịka atụrụ a na-aga igbu egbu, dịka atụrụ a na-akpachapụ ajị ya si anọ nwayọọ nʼihu ndị na-akpacha ya ajị, otu a ka o si nọdụ na-asagheghị ọnụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 53:7
17 Iomraidhean Croise  

E, adim ka madu nke nādighi-anu ihe Onye iba-nba ọ bula nādighi n'ọnu-ya.


N'ihi na Gi, Jehova, ka m'chereworo: Gi onwe-gi gāza, Onye-nwe-ayi, Chinekem.


N'ezie n'ihi Gi ka eb͕uworo ayi ogologo ubọchi nile; Aguwo ayi dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u.


Azum ka m'nyere ndi-oti-ihe, ǹtìm abua ka m'nyere ndi nēkwopu afu-ọnu: ezopughm irum n'ọnọdu-ihere anētiyem na ọbubú-ọnu.


Ayi nile kpafuru akpafu dika ìgwè aturu: ayi chere iru, onye ọ bula n'uzọ nke aka ya: ma Jehova emewo ka ajọ omume nke ayi nile dakwasi ya.


Ma mu onwem di ka nwa-aturu azùbiri azùbi nke anākpuru ije n'ob͕ub͕u-ya; ma amaghm na ọ bu mu ka ha zubereri nzube megide, si, Ka ayi bibie osisi na ihe-oriri-ya, ka ayi bipu kwa ya n'ala ndi di ndu, ka ewe ghara icheta kwa aha-ya ọzọ.


na otù nwa-oke-ehi, na otù ebulu, na otù nwa-ebulu nke b͕ara otù arọ, iji chu àjà-nsure-ọku;


Ma Jisus kpuchiri ọnu. Onye-isi-nchu-àjà we si Ya, Ewerem Chineke di ndu b͕a Gi iyí, ka I gwa ayi ma Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke.


Ma O kpuchiri ọnu, ọ dighi kwa ihe ọ bula Ọ zara. Onye-isi-nchu-àjà juba-kwa-ra Ya ọzọ, si Ya, Gì onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara nke Onye ahu agọziri agọzi?


Ma Jisus azaghi ihe ọ bula ọzọ; ya mere na o juru Pailat anya.


O we jua Ya ajuju n'ọtutu okwu; ma Ya onwe-ya azaghi ya ihe ọ bula.


N'echi-ya ọ hu Jisus ka Ọ nābiakute ya, o we si, Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa!


o we ba nime Pritoriọm ọzọ, we si Jisus, Òle ebe Gi onwe-gi si bia? ma ọ dighi ọziza Jisus zara ya.


Onye, mb͕e anēkwuto Ya, Ọ dighi-ekwutọghachi ọzọ; mb͕e Ọ nāhu ahuhu, Ọ dighi-aba nba; kama Ọ rara Onwe-ya nye n'aka Onye ahu Nke nēkpe ikpé ziri ezi:


M'we hu Nwa-aturu ka O nēguzo n'etiti oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu, guzo kwa n'etiti ndi-okenye ahu, dika agāsi na eb͕uru Ya-ri, O nwe-kwa-ra mpi asa, na anya asa, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke, bú nke ezigaworo ha n'uwa nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan