Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 53:3 - Bible Nso

3 Eledara ya anya, ọ bu kwa onye madu rara aka; onye nwere ọtutu ihe-nb͕u na onye mara ọria nke-ọma: e, dika onye madu nēzonari iru-ha, otú a ka eledara ya anya, ayi we ghara igu ya n'ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ndị mmadụ ledara ya anya, jụkwa ya. Ọ bụ onye nwere ọtụtụ ihe mgbu, bụrụkwa onye hụrụ ọtụtụ ahụhụ. Ma anyị gbakụtara ya azụ, jụ ilenye anya nʼebe ọ nọ. E, anyị ledara ya anya, jụ ịgụ ya dịka ọ bụ ihe ọbụla.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 53:3
38 Iomraidhean Croise  

Ma mu onwem bu onye ewedara n'ala na onye ihe nēb͕u nb͕u: Chineke, nzọputa-Gi gētiyem n'ebe di elu.


Aguwom na ndi nārida n'olùlù; Aghọwom onye di ka nwoke nēnweghi ike:


Otú a ka Jehova, bú Onye-nb͕aputa Israel na Onye Nsọ ya, siri onye madu nēleda, onye bu ihe-árú nke mba nka, onye bu orù ndi nāchi achi: Ndi-eze gāhu, we kpọ isi ala; n'ihi Jehova Nke kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye Nsọ nke Israel, Nke rọputaworo gi.


Azum ka m'nyere ndi-oti-ihe, ǹtìm abua ka m'nyere ndi nēkwopu afu-ọnu: ezopughm irum n'ọnọdu-ihere anētiyem na ọbubú-ọnu.


Dika ibobo gi si anwu ọtutu madu n'aru, (le ka iru-ya si buru ihe bibiri ebibi nke-uku kari onye ọ bula, udi-aru-ya kwa kari umu madu!)


Ma ọ tọrọ Jehova utọ izọpia ya; O mewo ka ọ ria ọria: ọ buru na nkpuru-obi-ya achu àjà-ikpe-ọmuma, ọ gahu nkpuru-ya, me ka ubọchi-ya nile di ogologo, ihe nke nātọ Jehova utọ gāga kwa nke-ọma n'aka-ya.


N'ezie ọria nile nke ayi ka ya onwe-ya bupuworo, ihe-nb͕u nile nke ayi kwa, o buruwo ha; ma ayi onwe-ayi guru ya n'onye etiworo ihe-otiti, onye Chineke tiworo ihe, na onye ewedara n'ala.


Ub͕u a ka i gēdo onwe-gi n'usu ndi nāpunara madu ihe, gi ada nke usu ndi nāpunara madu ihe: nnọchigide-n'agha ka ọ nọchigideworo ayi: ha gēji nkpa-n'aka tie onye-ikpe Israel na ǹtì.


M'we bipu ndi-ọzùzù-aturu atọ ahu n'otù ọnwa; nkpuru-obim enweghi kwa ntachi-obi n'aru ha, ọzọ, nkpuru-obi-ha asọwokwam oyi.


Mb͕e ahu ha busara Ya ọnu-miri n'iru, ti kwa Ya aka: ufọdu we pia Ya ihe,


si, Onye-nwe-ayi, ayi chetara na Onye-nduhie ahu siri, mb͕e Ọ nọ na ndu, Mb͕e ubọchi atọ gasiri M'gēsi n'ọnwu bilie.


si, Le, ayi nārigoro Jerusalem; agārara kwa Nwa nke madu nye n'aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ; ha gāma kwa Ya ikpe ọnwu, rara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ:


ha gēme kwa Ya ihe-ọchi, busa Ya ọnu-miri, pia Ya ihe, b͕ue Ya: Ọ gēsi kwa n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri.


O we si ha, Ọ nēwuta nkpuru-obim nke-uku, rue ọnwu: nọgidenu n'ebe a, nēche-kwa-nu nche.


Ha were kwa amì nēti Ya n'isi, ha nābusa kwa Ya ọnu-miri, ha we b͕ue ikperè nākpọ isi ala nye Ya.


O we si ha, Ọ bu ezie na Elaija bu uzọ bia, nēme kwa ka ihe nile di ka ha di na mbu: èsiwo kwa aṅa ede okwu a bayere Nwa nke madu n'akwukwọ nsọ, na Ọ gāhu ọtutu ahuhu, eme kwa Ya ihe-efu?


Ma ndi-Farisi, ndi nāhu ego n'anya, nuru ihe ndia nile: ha we me Ya ihe-ọchì.


Mb͕e Ọ biaruru Jerusalem nso, O we hu obodo ahu we kwara ya ákwá,


Ha we chìa Ya ọchì, ebe ha matara na ọ nwuru anwu.


si, Nwa nke madu aghaghi ihu ọtutu ahuhu, ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ aghaghi kwa iju Ya, aghaghi ib͕u kwa Ya, na ime kwa ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ.


Anya-miri puru n'anya Jisus.


Ndi-Ju zara, si Ya, Àyi onwe-ayi ekwughi nke-ọma, si na Gi onwe-Gi bu Onye Sameria, I nwe-kwa-ra mọ ọjọ?


Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu: I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi: O we rapu Chineke nke mere ya, We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu.


N'ihi na ayi enweghi onye-isi-nchu-àjà onye nāpughi iji obi so ayi hukọ ahuhu n'adighi-ike-ayi; kama ayi nwere Onye anwaworo n'ihe nile n'otù uzọ ahu anānwa ayi, ma O mehieghi.


Onye n'ubọchi nke anu-aru-Ya, mb͕e Ọ weresiri ikwa-ákwá siri ike na anya-miri che ekpere na aririọ n'iru Onye ahu puru izọputa Ya n'ọnwu, mb͕e anusi-kwa-ra olu-Ya n'ihi na Ọ turu egwu Chineke,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan