Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 52:2 - Bible Nso

2 Rurupu onwe-gi, si n'ájá puta; bilie, nọdu ala, Jerusalem; tọpu onwe-gi ab͕u di n'olu-gi, gi ada Zaion adọtara n'agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Kụchapụ aja dị nʼahụ gị, bilie ọtọ, gị Jerusalem, nọdụ ala nʼocheeze gị. Tọpụ onwe gị site nʼagbụ igwe e kere gị nʼolu, gị ada Zayọn, a dọtara nʼagha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 52:2
19 Iomraidhean Croise  

Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ibu arọ́ ya gēwezuga onwe-ya n'ubu-gi, yoke-ya gēwezuga kwa onwe-ya n'olu-gi, e, agēmebi yoke site na manu.


na M'gētipia Asiria n'alam, ọ bu kwa n'elu ugwum nile ka M'gāzọ ya ukwu: yoke-ya gēsi kwa n'olu-ha wezuga onwe-ya, ibu-ya gēsi n'elu ubu-ha wezuga onwe-ya.


Ewe me ka i di ala, site n'ala ka i gēkwu, ọ bu kwa n'ájá ka okwu-ọnu-gi gēsi puta, di ala; olu-gi gādi kwa ka onye nāju mọ ihe, ọ gēsi n'ala puta, okwu-ọnu-gi gēsi kwa n'ájá be ka umu-nnunu.


Ọnu-uzọ-ya nile gēze ume, ru kwa újú; agēme kwa ka ọ tọb͕ọrọ n'efu, ọ gānọdu n'ala.


I gāsi kwa n'obi-gi, Ònye muru ndia nyem, ebe mu onwem bu onye ab͕abaworo aka umu, na nwanyi-àgà, na onye emeworo ka ọ je biri n'ala ọzọ, na onye ewezugara ewezuga? ma ndia, ònye mere ka ha toputa? Le, mu onwem fọduru, náním; ndia, òle ebe ha nọ?


Onye-nkpọrọ nke nēruda eruda emewo ngwa ka atọpu ya; ọ gaghi anwu kwa we rida n'olùlù, nri-ya agaghi-akọ kwa ukọ.


ma M'gētiye ya n'aka ndi nēmekpa gi aru; ndi siri nkpuru-obi-gi, Ruda n'ala, ka ayi we gabiga: i we me ka azu-gi di ka ala na dika èzí nye ndi nāgabiga.


Bilie, nwue; n'ihi na ìhè-gi abiawo, ebube Jehova awawo kwa n'aru gi dika anyanwu.


Mọ nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, di n'arum; n'ihi na Jehova etewom manu izì ndi ewedara n'ala ozi ọma; O zitewom ikechi ọnyá ndi obi-ha tiwara etiwa, ikpọsa ọrira gwa ndi adọtara n'agha, na ikpọsa nmeghepu ulo-nkpọrọ gwa ndi ekere ab͕u;


N'ihi na yoke nke ibu-ya, na nkpa-n'aka nke ubu-ya, bú ndele nke onye nāchi ya n'ihe-ike, I nyajiwo ha, dika n'ubọchi nke Midian.


Sinu n'etiti ya pua, unu ndim, wepuganu onwe-unu n'otù n'otù n'iwe di ọku nke Jehova.


Unu ndi b͕apuworo na mma-agha, jenu, unu eguzola; chetanu Jehova site n'ebe di anya, ka Jerusalem bata kwa n'obi-unu.


Sinu n'etiti Babilon b͕alaga, wepuga-kwa-nu onwe-unu n'otù n'otù; unu ekwela ka eme unu ka unu dere du n'ajọ omume-ya: n'ihi na mb͕e ibọ̀-ọ́bọ̀ ka ọ buru Jehova; nmeso obodo ahu ka Ya onwe-ya nākwughachi ya.


Osisi ọhia gāmi kwa nkpuru-ya, ala gēme kwa ihe-ọmume-ya, ha gānọ kwa n'elu ala-ha na ntukwasi-obi; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'tijiworo nkpọrọ nile nke yoke-ha, naputa ha n'aka ndi mere ha ka ha fè ha òfùfè.


Éwù, éwù, sinu n'ala Ugwu b͕alaga, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na dika ifufe anọ nke elu-igwe ka M'chusaworo unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Éwù, gi Zaion, wepuga onwe-gi, gi nwanyi nke gi na ada Babilon nēbi.


Ha gāda kwa site n'ọnu mma-agha, agādọta kwa ha n'agha ga na mba nile: ndi mba ọzọ gāzọda Jerusalem n'ala, rue mb͕e oge nke mba ọzọ gēmezu.


Mọ nke Onye-nwe-ayi di n'arum. N'ihi na O terem manu izì ndi-ob͕enye ozi ọma: O ziteworom ikwusa ọrira gwa ndi adọtara n'agha, Na ikwusa ihu-uzọ gwa ndi-ìsi, Izipu ndi etihiawara aru ka ha la,


M'we nu olu ọzọ ka o nēsi n'elu-igwe dà, si, Ndi nkem, sinu nime ya puta, ka unu we ghara iso ya nwekọ nmehie-ya nile, ghara kwa inata ufọdu nime ihe-otiti-ya nile:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan