Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 52:12 - Bible Nso

12 N'ihi na ọ bughi na ngwa ka unu gāpu, ọ bughi kwa na nb͕alaga ka unu gēje: n'ihi na Onye nāga n'iru unu bu Jehova; ọzọ, Onye nāga n'azu unu bu Chineke Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ma unu agaghị eji ọkụ ọkụ pụọ, unu agakwaghị agbapụ ọsọ, nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebutere unu ụzọ, ọ bụkwa ya, Chineke Izrel, ga-echebe unu nʼazụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 52:12
23 Iomraidhean Croise  

Ọ gēru kwa, mb͕e i nuru olu ikiti-ukwu n'elu osisi balsam ahu, mb͕e ahu ka i gāpu ibu agha: n'ihi na Chineke apuwo n'iru gi itib͕u ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia.


Otú a ka unu gēri ya; n'iji ihe-ọkiké ke n'úkwù-unu, na akpukpọ-ukwú-unu n'ukwù, na nkpa-n'aka-unu n'aka-unu: unu gēri kwa ya na ngwa: ngabiga nke diri Jehova ka ọ bu.


Ndi Iiipt we di ike n'aru ndi Israel izipu ha n'ala-ha ngwa ngwa; n'ihi na ha siri, Ayi nile bu ndi nwuru anwu.


Ha we were utu ọka flour agwọrọ agwọ, bú nke ha si n'Ijipt bute, sie achicha ekoghi-eko, n'ihi na o koghi eko; n'ihi na achupuru ha n'Ijipt, ha apughi kwa inọ ọdù, ọzọ kwa, ọ dighi ihe iri n'uzọ ha doziri onwe-ha.


Jehova we me ka obi Fero, bú eze Ijipt, di ike, ọ we chu umu Israel n'azu: umu Israel nēwere kwa aka di elu pua.


Uzọ onye ezi omume nēso bu izi-ezi nile: Gi onye ziri ezi nēme ka uzọ onye ezi omume di lari.


n'ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri, Le, abum onye tọworo ntọ-ala na Zaion, bú otù nkume, nkume nke ọnwunwa, nkume-nkuku di oké ọnu-ahia nke bu ntọ-ala siri ike: onye nēkwere agaghi-ewere ọsọsọ b͕alaga.


M'ga-eme kwa ka ndi-ìsì je ije n'uzọ ha nāmaghi; n'okporo-uzọ ha nāmaghi ka M'gēme ka ọchichiri buru ìhè n'iru ha, me kwa ebe b͕agọrọ ab͕agọ ka ha guzozie. Ihe ndia ka M'gēme, M'gaghi-arapu kwa ha.


Mu onwem gāga n'iru-gi, me ka nkputankpu ebe nile guzozie: ibo-ọnu-uzọ ọla nile ka M'gētiwa, ihe-ntuchi ígwè nile ka M'gēb͕ujipu kwa:


Agu agaghi-agu ha, akpiri agaghi-akpọ kwa ha nku; miri na anyanwu agaghi-amab͕u kwa ha: n'ihi na Onye nwere obi-ebere n'aru ha gēdu ha, ọ bu kwa n'akuku isi-iyi nile juputara na miri ka O gēdu ha nwayọ.


M'gēme kwa ka ugwum nile ghọ uzọ, agēme kwa ka uzọm nile atuliri atuli di elu.


Onye-nkpọrọ nke nēruda eruda emewo ngwa ka atọpu ya; ọ gaghi anwu kwa we rida n'olùlù, nri-ya agaghi-akọ kwa ukọ.


Uzọ-ya nile ka M'huworo, M'gēme kwa ka aru di ya ike: M'gēdu kwa ya, nyeghachi ya nkasi-obi nile, nyeghachi kwa ndi-ya nēru újú.


Mb͕e ahu ka ìhè-gi gāwaputa dika ututu, anu-aru ọhu gēpuchi kwa n'aru-gi ngwa ngwa: ezi omume-gi gāga kwa n'iru gi: nsọpuru Jehova gāga n'azu gi.


Onye-ntipú ahu arigowo n'iru ha: ha etipúwo, we gabiga rue ọnu-uzọ-ama, pua na ya: eze-ha agabigawo kwa n'iru ha, Jehova kwa n'isi ha.


Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū umu Dan, nke nọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū nile, we bulie ije, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di: Ahieza nwa Amishadai nọ n'isi usu-ndi-agha-ya.


Erila achicha koro eko tiyere ya; ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko tiyere ya, bú achicha nweda-n'ala; n'ihi na i mere ngwa ngwa si n'ala Ijipt puta: ka i we nēcheta ubọchi ahu mb͕e i siri n'ala Ijipt puta ubọchi nile nke ndu-gi.


n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, bu onye nēso unu je, iburu unu agha megide ndi-iro-unu, ka O we zọputa unu.


O rue, mb͕e ndi Israel nile gabigasiri, na ib͕e Jehova gabigara, ya na ndi-nchu-àjà, n'iru ndi Israel.


Ndi ejikere we nēje n'iru ndi-nchu-àjà ndi nāfù opì-ike asa ahu, ndi nāchikọta achikọta nējeso kwa ib͕e ahu n'azu, ndi-nchu-àjà nāfù opì-ike asa ahu ka ha nēje.


Debora we si Berak, Bilie; n'ihi na nka bu ubọchi nke Jehova nyeworo Sisera n'aka-gi: Jehova, Ọ̀ pughi we je n'iru gi? Berak we si n'ugwu Teboa rida, ya na orú nnù ndikom na nnù ise ndi soro ya n'azu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan