Aịzaya 51:9 - Bible Nso9 Teta, teta, yiri ike dika uwe, gi ogwe-aka Jehova; teta, dika n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, bú ọb͕ọ nile nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga. Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu ihe ahu nke kpọwasiworo Rehab, nke mapúworo ogologo anu-miri? Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a9 Teta, teta, yikwasị onwe gị ike, gị aka Onyenwe anyị, bilie, dịka ụbọchị ndị gara aga, dịka ọgbọ nke mgbe ochie. Ọ bụghị gị gbubisịrị Rehab ma dụgbukwaa anụ ọjọọ ahụ? Faic an caibideil |
Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ nwawo ibà nime otù mba isi n'etiti ya were n'Onwe-ya mba ọzọ, n'ọnwunwa di iche iche, na n'ihe-iriba-ama di iche iche, na n'ihe-ebube di iche iche, na n'agha, na n'aka di ike, na n'ogwe-aka esetiri eseti, na n'oké egwu di iche iche, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-unu, mere unu n'Ijipt n'anya-unu?