Aịzaya 51:3 - Bible Nso3 N'ihi na Jehova akasiwo Zaion obi: Ọ kasiwo nkpọnkpọ ebe-ya nile, me ka ọzara-ya di ka Iden, me ka ala-ya nke ihe nādighi di ka ubi Jehova ab͕ara ogige; obi-utọ na ọṅù ka agāhu nime ya, na ekele, na olu abù ọma. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a3 Onyenwe anyị aghaghị ịkasị Zayọn obi, werekwa obi ebere leta ebe ya niile e tikpọrọ etikpọ, ọ ga-eme ala ọzara ya niile ka ọ dịka Iden, ala ya nke niile ihe na-adịghị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke Onyenwe anyị. Ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼime ya, inye ekele na ụda abụ ụtọ dị iche iche ga-adịkwa. Faic an caibideil |
Obi gātọm utọ nke-uku nime Jehova, nkpuru-obim gēteghari egwú ọṅù nime Chinekem; n'ihi na Ọ chiriwo uwe nzọputa yikwasim, O werewo uwe-nwuda ezi omume kpuchiem, dika onye nālu nwunye ọhu si ewere ihe ọma ike n'isi ke onwe-ya dika onye-nchu-àjà, na dika nwanyi anālu ọhu si ewere ihe-ejiji-ya nile chọ onwe-ya nma.
N'Iden, bú ubi Chineke ab͕ara ogige, ka i nọworo; nkume nile ọ bula nke di oké ọnu-ahia bu ihe-nkpuchi-gi: bú sardius, na topaz, na diamond, na beryl, na onyx, na jasper, na sapphire, na esmerald, na carbuncle, na ọla-edo: ije-ozi nke egwú-otiti-gi nile na ọ̀jà-gi nile di nime gi; n'ubọchi ekère gi, mb͕e ahu ka edoziri ha.