Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 51:15 - Bible Nso

15 Mu onwem bu kwa Jehova Chineke-gi, Onye nēme ka oké osimiri dere du, mb͕e nmali-miri-ya nile nēbib͕ọ: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye na-akpali oke osimiri mee ka ebili mmiri ya bigbọọ, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 51:15
16 Iomraidhean Croise  

I kewa-kwa-ra oké osimiri n'iru ha, ha we gabiga n'etiti oké osimiri n'elu ala-akọrọ; ma I tubàra ndi nāchu ha na miri di omimi, dika nkume nime miri di ike.


Ike-Ya ka O ji me oké osimiri ka o dere du, Nghọta-Ya kwa ka O ji tib͕u Rehab.


N'ihi na Ọ nēkwu okwu, O we me ka oké ifufe guzo ọtọ, Nke nēbuli nmali-miri-ya nile elu.


Kelenu Onye kebiworo Oké Osimiri Uhie: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:


Gi onwe-gi were ike-Gi tiwa oké osimiri: I tipiara isi nile nke ogologo anu-miri n'elu miri.


M'gēwere kwa unu n'Onwem ka unu buru otù ndi, M'gābu-kwa-ra unu Chineke: unu gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova Chineke-unu, Nke nēme ka unu si n'okpuru ibu nile nke ndi Ijipt puta.


Onye-nb͕aputa-ayi, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya, bú Onye Nsọ nke Israel.


N'ihi na ha akpọwo onwe-ha ndi sitere n'obodo nsọ, ọ bu kwa Chineke Israel ka ha dabereworo; Jehova usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.


Ọ̀ bughi gi onwe-gi bu ihe ahu nke meworo ka oké osimiri tasia, bú miri nke ob͕u-miri riri nne; nke meworo ebe nile miri emi nke oké osimiri ka ọ ghọ uzọ ndi emeworo ka ha nwere onwe-ha gēsi gabiga?


N'ihi na di-gi bu Onye meworo gi; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: ọzọ, onye-nb͕aputa-gi bu Onye Nsọ nke Israel; Chineke nke uwa nile ka anākpọ Ya.


Ọ bughi dika ihe ndia ka Òkè Jekob bu; n'ihi na onye nākpu ihe nile ka Ọ bu; Israel bu kwa ebo nke ihe-nketa-Ya: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.


Otú a ka Jehova siri, bú Onye nēnye anyanwu ka ọ buru ìhè n'ehihie, na ukpuru nile nke ọnwa na nke kpakpando nile ka ha buru ìhè n'abali, Onye nēme ka oké osimiri dere du mb͕e nmali-miri-ya nile nēbib͕ọ; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya:


N'ihi na Israel, ma-ọbu Juda, abughi nwanyi nke di-ya, bú Chineke-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwuru anwu; ọ bu ezie na ala-ha juputara n'ikpe-ọmuma megide Onye Nsọ nke Israel.


N'ihi na Mu onwem bu Jehova Chineke-unu: unu gēdo kwa onwe-unu nsọ, we di nsọ; n'ihi na nsọ ka Mu onwem di: unu eji-kwa-la ihe-nnuputa ọ bula nke nākpu akpu n'elu uwa meru onwe-unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan