Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 51:12 - Bible Nso

12 Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu nākasi unu obi; ònye ka i bu, na i nātu egwu madu gānwu anwu, na i nātu egwu nwa madu nke agēme ka ọ di ka ahihia;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 “Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, bụ Onye ahụ na-akasị unu obi. Onye ka ị bụ, na ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke ga-anwụ anwụ, ị na-atụ egwu nwa mmadụ nke bụ naanị ahịhịa,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 51:12
37 Iomraidhean Croise  

Mọ-ozi nke Jehova we si Elaija, Soro ya rida: atula egwu ya. O we bilie, soro ya ridakuru eze.


Jehova dirim; m'gaghi-atu egwu: Gini ka madu gēmem?


Mọ-ya nāpu apu, o we laghachi n'ala o si puta; N'ubọchi ahu èchìchè-ya nile alawo n'iyì.


Mb͕e ndi nēmebi iwu nāma akwukwọ dika ihe-ọkukú, Mb͕e ndi nile nke nalu ajọ ihe nāwa kwa okoko-osisi; Ọ bu ka ewe kpochapu ha rue mb͕e nile ebighi-ebi:


Ọtutu madu nāchọ iru onye nāchi achi: Ma n'aka Jehova ka ikpé onye ọ bula nēsi bia.


Le, Chineke bu nzọputam; m'gātukwasi Ya obi, ghara itu egwu: n'ihi na ikem na abù ọmam ka Ja JEHOVA bu; O we ghọrọm nzọputa.


Rapunu madu, onye otù nku-ume di n'imi-ya: n'ihi na nìme gini ka aganāgu ya?


Kasienu, kasienu ndim obi, ka Chineke-unu nāsi.


Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu Nke nēchichapu njehie-gi nile n'ihi Mu onwem; M'gaghi-echeta kwa nmehie-gi nile.


Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe; tegharia egwú ọṅù, gi uwa; tiwanu nkpu ọṅù, unu ugwu: n'ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru ndi-Ya ewedara n'ala.


N'ihi na Jehova akasiwo Zaion obi: Ọ kasiwo nkpọnkpọ ebe-ya nile, me ka ọzara-ya di ka Iden, me ka ala-ya nke ihe nādighi di ka ubi Jehova ab͕ara ogige; obi-utọ na ọṅù ka agāhu nime ya, na ekele, na olu abù ọma.


Tiwanu nkpu ọṅù, tienu nkpu ọṅù n'ọtù, unu nkpọnkpọ ebe nke Jerusalem: n'ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ b͕aputawo Jerusalem.


Ma ònye ka i cheb͕uworo onwe-gi bayere ya, we tua egwu ya, na i nēkwu okwu-ugha, we ghara ichetam, ghara kwa itiye ya n'obi-gi? Mù onwem adighi-ab͕a nkiti ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, i we ghara itu egwum?


ikpọsa arọ mb͕e ihe madu nātọ Jehova utọ, na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ Chineke-ayi nwere; ikasi ndi nile nēru újú obi;


Dika onye nke nne-ya nākasi obi, otú a ka Mu onwem gākasi unu obi; ọ bu kwa nime Jerusalem ka agākasi unu obi.


Unu agaghi-asi, Nkekọta imegide eze, n'ihe nile nke ndi nka nāsi, Ọ bu nkekọta imegide eze; unu agaghi-atu kwa egwu ihe ha nātu egwu ya, unu agaghi-ama-kwa-ra ya jijiji.


Eze, bú Zedekaia, we si Jeremaia, Mu onwem nātu egwu ndi-Ju ndi dakuruworo ndi Kaldea, na ha gēnyem n'aka-ha, ha ewe kwam emò.


n'ihi ndi Kaldea: n'ihi na ha turu egwu ha, n'ihi na Ishmael nwa Netanaia etib͕uwo Gedalaia nwa Ahaikam, onye eze Babilon mere onye-nlekọta ala-ha.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, atula egwu ha, atu-kwa-la egwu okwu nile ha, asi na ogwu na uke di n'ebe i nọ, asi kwa na ọ bu n'etiti akpi ka i bi: atula egwu okwu nile ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.


Unu atu-kwa-la egwu ndi nēb͕u aru, ma ha apughi ib͕u nkpuru-obi: kama nātunu egwu Onye ahu Nke puru ila nkpuru-obi na aru n'iyì n'ọku ala-mọ.


M'gaghi-arapu unu ka umu-nb͕ei: agajem ibiakute unu.


Ya mere nzukọ Kraist nime Judia na Galili na Sameria dum nwere udo, ebe anēwuli ya elu dika ulo; ọ nāba kwa uba, ebe ọ nāga n'egwu Onye-nwe-ayi na nkasi-obi nke Mọ Nsọ.


N'ihi na, Anu-aru nile di ka ahihia, Ebube-ya nile di kwa ka uzari ahihia. Ahihia akpọnwuwo, uzari-ya adapuwo kwa:


Sọl we si Samuel, Emehiewom: n'ihi na agabigawom okwu-ọnu Jehova na okwu-gi nile: n'ihi na aturum egwu ndi Israel, we ge nti olu-ha.


Sọl na Israel nile we nu okwu nile ndia nke onye Filistia, ha we tua ujọ, tua egwu nke-uku.


O we b͕anwe omume-ya n'anya-ha, me onwe-ya dika onye anya-ya nādighi nma n'aka-ha, ọ ka kwa akàrà n'ibo ọnu-uzọ-ama, nāgusisi kwa ọnu-miri-ya n'afu-ọnu-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan