Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 50:6 - Bible Nso

6 Azum ka m'nyere ndi-oti-ihe, ǹtìm abua ka m'nyere ndi nēkwopu afu-ọnu: ezopughm irum n'ọnọdu-ihere anētiyem na ọbubú-ọnu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Azụ m ka m megheere ndị tiri m ihe; agba nti m abụọ ka m hapụụrụ ndị hopusiri m afụọnụ m. Ezopụghị m ihu m nʼebe ndị na-akwa emo, na ndị na-agbụ ọnụ mmiri nọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 50:6
20 Iomraidhean Croise  

Mu na ha we se okwu, m'we kọcha ha, tie ufọdu nime ha aka, kwopu agiri-isi-ha, me ka ha were Chineke ṅua iyi, si, Unu ewela umu-unu ndinyom nye umu-ha ndikom, unu aluta-kwa-lara umu-unu ndikom, ma-ọbu onwe-unu, umu-ha ndinyom.


Ha asaghepuwo ọnu-ha n'arum, Were ita-uta tiem aka na ǹtì: Ha nāchikọzu onwe-ha n'otù imegidem.


Ha nākpọm ihe-árú, ha nọ n'ebe di anya site n'ebe m'nọ, Ha eb͕ochighi kwa onwe-ha n'ibu ọnu-miri n'irum.


N'elu azum ka ndi-plough jiri plough gwu dika esi egwu ala-ubi; Ha mere ka furrow nile ha di ogologo.


N'ihi na ọ bu n'ihi Gi ka m'būworo ita-uta; Ihere ekpuchiwo irum.


Aghọworom umu-nnem onye ala ọzọ, Ghọ-kwa-ra umu nnem muru onye mba ọzọ.


Ma ya onwe-ya bu onye amapúworo site na njehie nile nke ayi, onye azọpiaworo site n'ajọ omume nile nke ayi: ahuhu-nmehie nke udo-ayi di n'aru ya; ọ bu kwa ubiri-utari-ya ka ejiri me ka aru-ayi di ike.


Achiri ya n'ihe-ike, ma ya onwe-ya wedara onwe-ya n'ala, we ghara isaghe ọnu-ya; dika aturu nke anākpuru ije n'ob͕ub͕u-ya, na dika nne-aturu nke dara ob͕i n'iru ndi nākpacha ya aji; e, ọ dighi-asaghe ọnu-ya.


Ya mere ǹtì-ya nye onye nēti ya ihe; ka ita-uta ju ya afọ.


Ub͕u a ka i gēdo onwe-gi n'usu ndi nāpunara madu ihe, gi ada nke usu ndi nāpunara madu ihe: nnọchigide-n'agha ka ọ nọchigideworo ayi: ha gēji nkpa-n'aka tie onye-ikpe Israel na ǹtì.


Jehova we si Moses, Ọ buru na nna-ya ab͕asa ya asọ n'iru ma-ọli, ìhere agaghi-eme ya ubọchi asa? ka emechibido ya uzọ n'azu ọmuma-ulo-ikwū ubọchi asa, emesia agāchikọta kwa ya na ndi Israel.


Mb͕e ahu ha busara Ya ọnu-miri n'iru, ti kwa Ya aka: ufọdu we pia Ya ihe,


Mb͕e ahu ọ rapuru ha Barabas: ma ọ rara Jisus nye, mb͕e ọ piasiri Ya ihe, ka ewe kpọgide Ya n'obe.


Ha busa-kwa-ra Ya ọnu-miri, were kwa amì ahu nēti Ya n'isi.


ma Mu onwem si unu, Eguzogidela onye bu ajọ onye: kama onye ọ bula nāku gi ura na ǹtì aka-nri, tughari-kwa-ra ya ǹtì ọzọ.


Ufọdu we malite ibusa Ya ọnu-miri, na ikechi iru-Ya, na iti Ya aka, na isi Ya, Bu amuma: ndi nēje ozi we nara Ya n'ipia Ya ihe.


Ha were kwa amì nēti Ya n'isi, ha nābusa kwa Ya ọnu-miri, ha we b͕ue ikperè nākpọ isi ala nye Ya.


Ma mb͕e O kwusiri okwu ndia, otù onye nime ndi nēje ozi nke nēguzo nso we pia Jisus ihe, si, Ì nāza onye-isi-nchu-àjà otú a?


nēlegide Jisus anya, bú onye-ndú na onye-nmezu nke okwukwe-ayi, Onye n'ihi ọṅù edebere n'iru Ya nātachi obi n'obe-Ya, nēlelì ihere anya, O we nọdu n'aka-nri nke oche-eze Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan