Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 50:4 - Bible Nso

4 Onye-nwe-ayi, bú Jehova, enyewom ire nke ndi-nmuta, ka m'we mara iwere okwu kwagide onye dara #mbà: Ọ nākpọte ntim kwa-ututu, Ọ nākpọte ntim inu ihe dika ndi-nmuta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị enyela m amamihe ya ka m nwee ike ịmata ihe m ga-agwa ndị a ike gwụrụ. Ụtụtụ niile ka ọ na-akpọte mmụọ m, meghee akpa uche m, ime ka m ghọta uche ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 50:4
31 Iomraidhean Croise  

Okwu-gi nēme ka onye nāsu ngọngọ guzosie ike, I nāb͕a kwa ikperè nēruru ala ume.


Eburum chi-ọbubọ uzọ, we tikue Gi: Okwu-Gi nile ka m'chere.


Mem ka m'nuru ebere-Gi n'ututu; N'ihi na Gi ka m'tukwasiworo obi: Mem ka m'mara uzọ nke m'gēje ije nime ya; N'ihi na Gi ka m'buliworo nkpuru-obim nye.


Mb͕e ahu ka M'siri, Le, abiawom; N'akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem:


Emewo gi ka i ma nma kari umu madu; Awukwasiwo amara n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua: N'ihi ya Chineke agọziwo gi rue mb͕e ebighi-ebi.


Jehova, n'ututu ka I gānu olum; N'ututu ka m'gēdoro Gi ekperem n'usoro, che kwa nche.


Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m'tikuworo, Jehova, Ọ bu kwa n'ututu ka ekperem gēje izute Gi.


Ncheb͕u n'obi madu nēme ka obi ruru ala; Ma okwu ọma nēme ka ọ ṅuria.


Ọṅù diri onye ọ bula n'ọziza-okwu nke ọnu-ya: Ọzọ, okwu ekwuru na mb͕e-ya, le ka o si di nma nke-uku!


Nkpuru-osisi apple ọla-edo nime nkata ọla-ọcha Ka okwu ekwuru na mb͕e kwesiri ya bu.


Mb͕e ọ bula ọ nāgabiga ọ gējide unu; n'ihi na kwa-ututu ka ọ gāgabiga, n'ehihie na n'abali: o we buru nání ọma-jijiji ighọta ihe anuru.


Ònye ka ọ gēzí ihe-ọmuma? ọ̀ bu kwa onye ka ọ gēme ka ọ ghọta ihe anuru? ọ̀ bu ndi emeworo ka ha rapu iṅu miri-ara, ndi anapuru ara?


Mb͕e ahu ka agēmeghe anya ndi-ìsì, ọ bu kwa nti nke ndi nti chiri ka agēmeghe.


Ọ bu Onye nēnye onye dara #mbà ike; onye ike nādighi ka Ọ nēme kwa ka ọ nwe ume n'uba.


Onye n'etiti unu bu onye nātu egwu Jehova, nēge nti n'olu orù-Ya? onye nke jeworo ije n'ọchichiri, nke ọ dighi onwunwu-ọku o nwere, ya tukwasi obi n'aha Jehova, dabere Chineke-ya.


Ọzọ, umu-gi nile gābu ndi-nmuta Jehova; udo nke umu-gi gāba kwa uba.


Kechie ihe-àmà, kà iwu akàrà n'etiti ndi-nmutam.


Jehova we setipu aka-Ya, me ka o rutu ọnum: Jehova we sim, Le, etinyewom okwum nile n'ọnu-gi:


N'ihi na emewom ka afọ jubiga nkpuru-obi nāda #mbà ókè, ọ bu kwa nkpuru-obi ọ bula nke nēru újú ka M'juworo.


Ọzọ, otù nwa-aturu nke b͕ara otù arọ nke zuru okè ka i gēdozi ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova kwa-ubọchi: kwa-ututu kwa-ututu ka i gēdozi ya.


Biakutenum, unu nile ndi nādọb͕u onwe-unu n'ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ́, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike.


O we bia n'ala nke aka Ya, nēzí ha ihe n'ulo-nzukọ-ha, nke mere ka ibobo nwua ha n'aru, ha we si, Òle ebe ka Nwoke a nwere amam-ihe a na ọlu ndia di ike?


Ma ọ dighi onye ọ bula puru iza Ya okwu, ọ dighi kwa onye nwere anya-ike site n'ubọchi ahu iju Ya ajuju ọzọ.


n'ihi na Mu onwem gēnye unu ọnu na amam-ihe, nke ndi nile nēmegide unu nāgaghi-apu iguzogide ma-ọbu ikwugide okwu.


Ha nile we buru ndi-àmà-Ya, okwu nile nke amara nke si n'ọnu-Ya puta nēju kwa ha nile anya: ha we si, Onye a, Ọ̀ bughi Nwa Josef?


Ndi ahu ndi nēje ozi zara, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula madu kwuru okwu di otú a.


Jehova we sim, Ha ekwuwo nke-ọma okwu nke ha kwuworo.


M'gēme ka onye-amuma, nke di ka gi, biliere ha site n'etiti umu-nne-ha; M'gētiye kwa okwum nile n'ọnu-ya, ọ gāgwa kwa ha okwu nile nke M'gēnye ya n'iwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan