Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 5:21 - Bible Nso

21 Ahuhu gādiri ndi mara ihe n'anya ha onwe-ha, ndi nēle kwa onwe-ha anya na ha bu ndi-nghọta!

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe nʼanya nke onwe ha, ndị na-elekwa onwe ha anya na ha bụ ndị nwere nghọta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 5:21
13 Iomraidhean Croise  

Ma nkpọkọrọ madu gēnwe obi, Mb͕e amuru nwa-inyinya-ibu-ọhia ka ọ buru madu.


Ì huwo onye ọ bula nke bu onye mara ihe n'anya-ya? Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.


Onye-ume-ngwu bu onye mara ihe n'anya-ya Kari madu asa ndi nāzaghachi okwu n'ezi uche.


Abula onye mara ihe n'anya gi onwe-gi; Tua egwu Jehova, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-gi:


N'ihi na ọ siwo, Site n'ike akam ka m'meworo ya, na site n'amam-ihem; n'ihi na enwerem nghọta: m'we wezuga ókè ndi nile di iche iche, ọzọ, ihe-ha nke ejikereworo ka m'punara ha, m'we buda, dika onye di ike, ndi nānọdu n'ọche-eze;


Ònye ka i taworo uta, kwulu kwa? Ònye ka i mewo-kwa-ra olu-gi ka ọ di elu, weli kwa anya-gi abua imegide Ya? ọ bu imegide Onye Nsọ nke Israel.


Nke nēme ndi-isi ka ha ghọ ihe-efu; Ọ mewo ndi-ikpe uwa ka ha di ka ebe tọb͕ọrọ n'efu.


I we tukwasi obi n'ihe ọjọ gi; i siwo, Ọ dighi onye nāhum; amam-ihe-gi na ihe-ọmuma-gi, nke ahu emewo ka i laghachi azu: i we si n'obi-gi, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem.


Jisus siri ha, Ọ buru na unu kpuru ìsì, unu agaghi-enwe nmehie: ma ub͕u a unu nāsi, Ayi nāhu uzọ: nmehie-unu nānọgide.


Mb͕e ha nēkwu na ha bu ndi mara ihe, ha we ghọ ndi-nzuzu,


N'ihi na achọghm ka unu ghara ima ihe-omimi a, umu-nnam, ka unu ghara inwe uche n'anya onwe-unu, na emewo Israel obi-etili ufọdu, rue mb͕e ozùzù ndi mba ọzọ gābata;


Nātukwasinu uche n'otù ihe ahu n'ebe ibe-unu nọ. Unu atukwasila uche n'ihe di elu, kama ka ndi ọnọdu-ha di ala nādọrọ unu iso ha. Unu enwela uche n'anya onwe-unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan