Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 5:12 - Bible Nso

12 Ubọ-akwara na une na egwú-otiti na ọ̀jà na manya-vine di kwa n'ọṅuṅu-manya-vine-ha nile: ma ha adighi-elegide ọlu Jehova anya, ha ahughi kwa ihe aka-Ya abua nēme.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une, na ihe iti egwu na opi, na mmanya na-eme onwe unu obi ụtọ nʼoge mmemme oriri unu, ma unu na-elelị Onyenwe anyị anya; unu adịghịkwa asọpụrụ akaọrụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 5:12
20 Iomraidhean Croise  

N'ìhi gini ka i b͕ala-gara na nzuzo, we ghọb͕uem? ọ̀ bụ kwa n'ihi gini ka i nēgosighm, ka m'we were ọṅù, were kwa abù, were kwa egwú-otiti, were kwa ubọ-akwara, zilaga gi?


Ọgu arọ anọ ka m'b͕ara ta: m'gāmara ihe di iche n'etiti ezi ihe na ihe ọjọ? òrù-gi gāmata utọ ihe m'nēri ma-ọbu nke m'nāṅu? m'gēge nti ọzọ n'olu ndikom nābu abù na ndinyom nābu abù? n'ihi gini kwa ka orù-gi gāburu onye-nwem, bú eze, ibu ọzọ?


N'ihi na ha esiwo n'iso Ya wezuga onwe-ha, Ha eweghi kwa uche le uzọ-Ya nile anya:


N'ihi na ha adighi-aghọta ọlu nile nke Jehova, Na n'ihi na ha adighi-aghọta ihe aka-Ya abua meworo, Ọ gākwada ha, Ọ gaghi-ewulita ha elu dika ulo.


ma, le, obi-utọ na ọṅù, ob͕ub͕u ìgwè ehi na ob͕ub͕u ìgwè ewu na aturu, oriri anu na ọṅuṅu manya-vine: ka ayi rie ṅu kwa, n'ihi na echi ka ayi gānwu.


Obi-utọ nke egwú-otiti nile akwusiwo, nkpọtu nke ndi nāṅuri ọṅu-agha agwuwo obi-utọ nke ubọ-akwara akwusiwo.


Ahuhu gādiri Eriel, Eriel, bú obodo ebe Devid mara ulo-ikwū-ya! Tukwasinu arọ n'arọ; ka ememe nile b͕agharute na mb͕e-ha:


ndi nāsi; Ya me ngwa, Ya lua ọlu-Ya ọsọsọ, ka ayi we hu: ka ndum-ọdu nke Onye Nsọ nke Israel bia rue ayi nso bia, ka ayi we mara.


Ha si, Bianu, ka m'weta manya-vine, ka ayi ṅubiga kwa ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ókè; echi gādi kwa ka ta, ubọchi di uku gabiga ókè nke-uku.


M'gēme kwa ka ùzù nke abù-gi nile kwusi; agaghi-anu kwa olu nke ubọ-akwara-gi nile ọzọ.


ma ọ bu imegide Onye-nwe elu-igwe ka i buliworo onwe-gi; ọ bu kwa aria nile nke ulo-Ya ka ha chitaworo n'iru gi, gi onwe-gi na ndi-isi-gi na ndi bu nwunye-gi na ndi-iko-gi nwanyi nāṅu kwa manya-vine nime ha; ọ bu kwa chi nile nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume, nke nādighi-ahu uzọ, nke nādighi-anu kwa ihe, nke nādighi-ama kwa ihe, ka i jaworo: ma Chineke ahu Onye ume-gi di n'aka-Ya, Onye nwe-kwa-ra uzọ-gi nile, ka i nāsọpurugh:


Ma otù ọgaranya di, o nēyi kwa uwe ododo na ezi ákwà ọcha, ọ nēme kwa ka obi nātọ ya utọ nke-ọma kwa-ubọchi:


Ọbuná ihe nējighi ndu, mb͕e olu-ha nāda udà, ma ọ bu ọ̀jà ma-ọbu ubọ-akwara, ọ buru na ọ dighi ihe di iche n'olu-ha, àgēsi aṅa mara ihe anāfù ma-ọbu nke anākpọ?


Ndia bu ndi nke bu nkume zoro ezo n'oriri ihu n'anya unu mb͕e ha nēso unu rikọ ihe nātughi egwu, ndi nāzù onwe-ha dika aturu; ha bu igwe-oji nke miri nādighi, nke ifufe nēfeghari; buru kwa osisi nāmighi nkpuru n'oge nkpuru, nke nwuru anwu ub͕ò abua, nke eropuru eropu;


Nání tuanu egwu Jehova, were obi-unu nile fè Ya òfùfè n'ezi-okwu: n'ihi na, lenu ihe uku O meworo n'ebe unu nọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan