Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 5:11 - Bible Nso

11 Ahuhu gādiri ndi nēbili n'isi-ututu ib͕aso ihe-ọṅuṅu nābà n'anya; ndi nānọ ogologo mb͕e n'anyasi, manya-vine ewe me ka aru nwuru ha ọku.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ahụhụ ga-adịrị unu niile ndị na-ebili nʼisi ụtụtụ ịgbaso mmanya. Ndị na-amụgide anya abalị tutu ruo mgbe ha ṅụbigara mmanya oke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 5:11
21 Iomraidhean Croise  

Ọgu arọ anọ ka m'b͕ara ta: m'gāmara ihe di iche n'etiti ezi ihe na ihe ọjọ? òrù-gi gāmata utọ ihe m'nēri ma-ọbu nke m'nāṅu? m'gēge nti ọzọ n'olu ndikom nābu abù na ndinyom nābu abù? n'ihi gini kwa ka orù-gi gāburu onye-nwem, bú eze, ibu ọzọ?


Onye nākwa emò ka manya-vine bu, onye-nkpọtu ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya bu; Onye ọ bula nke nāwaghari site na ya amaghi ihe.


N'ikpe-azu-ya ọ bu dika agwọ ka ọ nāta, Ọ bu kwa dika aju-ala ka ọ nātu.


ma, le, obi-utọ na ọṅù, ob͕ub͕u ìgwè ehi na ob͕ub͕u ìgwè ewu na aturu, oriri anu na ọṅuṅu manya-vine: ka ayi rie ṅu kwa, n'ihi na echi ka ayi gānwu.


Ha agaghi-eji abù ṅu manya-vine; ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya gādi ndi nāṅu ya ilu.


Ahuhu gādiri okpu-eze npako nke ndi Efraim nāṅubiga manya ókè, ahuhu gādi-kwa-ra okoko-ọhia nākpọnwu akpọnwu nke ima-nma-ya mara nma, nke di n'isi nke ndagwurugwu di urù nke ndi manya-vine nēb͕u!


N'okpuru ukwu ka agāzọda okpu-eze npako nke ndi Efraim nāṅubiga manya ókè:


Ahuhu gādiri ndi-dike n'iṅu manya-vine, ndi bu kwa dìnkpà n'itigwa ihe-ọṅuṅu n'anya:


Ha si, Bianu, ka m'weta manya-vine, ka ayi ṅubiga kwa ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ókè; echi gādi kwa ka ta, ubọchi di uku gabiga ókè nke-uku.


Ahuhu diri onye nēme ka madu-ibe-ya ṅua ihe, onye nāgwakọta ya na ọnuma-gi, ọzọ, i nēme kwa ka ọ ṅubiga manya ókè, ka i we legide ọtọ-ha anya!


E, ọzọ kwa, n'ihi na manya-vine-ya bu ihe-nghọb͕u, nwoke di nganga ka ọ bu nke nādighi-anọ kwa n'ulo; onye meworo ka ọchichọ-nkpuru-obi-ya sa mbara dika ala-mọ, ya onwe-ya di kwa ka ọnwu, afọ adighi-eju kwa ya, o we me ka mba nile zukọta n'ebe ọ nọ, ọ nāchikọta kwa ndi nile di iche iche n'ebe ọ nọ.


Ma nēzenu onwe-unu, ka aghara iwere imebiga-ajọ-ihe-ókè, na iṅubiga-manya-ókè, na ncheb͕u nke ndu a, bob͕u obi-unu ma eleghi anya, ubọchi ahu we biakwasi unu na mberede dika ọnyà;


Ka ayi nējeghari dika ọ kwesiri ayi, dika n'ehihie; ọ bughi n'ite-egwú na iṅubiga-manya-ókè, ọ bughi n'ikwa-iko na agu ikwa-iko, ọ bughi n'esem-okwu na ekworo.


ma-ọbu ndi-ori, ma-ọbu ndi-anya-uku, ma-ọbu ndi nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu ndi-nkwutọ, ma-ọbu ndi nāpunara madu ihe, ha agaghi-eketa ala-eze Chineke.


ikpọ-asì, iṅubiga-manya-ókè, ite-egwú, na ihe yiri ihe ndia: nke m'buru uzọ gwa unu, dika m'buru uzọ gwa unu n'oge gara aga, na ndi nēme ihe di otú a agaghi-eketa ala-eze Chineke.


Abigail we biakute Nebal; ma, le, o nwere oké oriri n'ulo-ya, dika oké oriri eze; obi Nebal we di nma nime ya, ọ ṅubiga-kwa-ra manya okè nke-uku: Abigail we ghara igosi ya okwu ọ bula, okwu ntà ma-ọbu okwu uku, rue ìhè ututu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan