Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 5:10 - Bible Nso

10 N'ihi na ala ubi-vine nke madu gēji ehi abua alu n'ubọchi iri gēweputa nání otù ihe-ọtùtù bath nke manya-vine, ọzọ, otù ihe-ọtùtù homer nke nkpuru-ọghigha gāmi nání otù ihe-ọtùtù ephah.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ubi vaịnị ahụ a ga-eji ehi abụọ kọọ ụbọchị iri ga-ewepụta naanị ihe nwere ike iru galọọnụ mmanya isii, ma ọka a kọrọ, nke ruru akpa ọka atọ ga-amịpụta ihe ruru otu akpa nʼọkara.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 5:10
13 Iomraidhean Croise  

Isi-ha na alaka-ha sitere na ya; ihe-idọba-oriọna ahu nile bu otù ihe eji ọla-edo nke anāgwaghi agwa kpu.


n'ihi ala ndim, nke ogwu n'uke nēpute nime ya, e, n'elu ulo nile nke obi-utọ n'obodo nāṅuri ọṅu-agha:


O gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ebe ọ bula, nke nnù vine abua na ọgu iri di ya, nke ọnu-ahia-ha bu nnù ego ọla-ọcha abua na ọgu iri, ọ gādiri ogwu, di-kwa-ra uke.


Ewepuwo kwa ọṅù na iteghari-egwú-ọṅù n'ubi ọma na n'ala Moab; emewokwam ka manya-vine kwusi n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile: ọ dighi onye gēji iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine zọcha nkpuru-vine; iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine agaghi-abu iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine.


Nkpuru-ọghigha akpọnwuwo n'okpuru ọkpurukpu-ájá-ha; emewo ka ulo nile anēdebe ihe-oriri tọb͕ọrọ n'efu, akwatuwo ọba nile; n'ihi na ihere emewo ọka.


Mb͕e M'gākpajiri unu nkpa-n'aka-unu, bú achicha, ndinyom iri gēsi achicha-unu n'otù ite-ọku, ha gēweghachi kwa achicha-unu n'ọtùtù: unu gēri kwa, ma afọ agaghi-eju unu.


Ma ọ buru na onye ọ bula ewere ufọdu nime ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya doro Jehova nsọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi gādi kwa ka nkpuru-ọghigha-ya si di; otù homer nke nkpuru-ọghigha ọka barley, agārù ọnu-ya n'ọgu shekel ọla-ọcha abua na iri.


Unu aghawo ọtutu nkpuru, ma nke-ntà ka unu webatara; unu nēri ihe, ma ọ dighi afọ juworo unu; unu nāṅu ihe-ọṅuṅu, ma ọ dighi nṅuju-afọ unu ṅujuworo; unu yiri uwe, ma ọ dighi okpom-ọku nēkpo madu; ọzọ, onye nāluta ugwọ-ọlu nāluta ugwọ-ọlu itiye n'akpa puru epu.


na mb͕e ahu nile, mb͕e madu biara n'obo-ihe di orú ọtùtù, ha di nání iri; mb͕e madu biara n'ebe-inara-manya-vine ikupu ọgu ite abua na iri, nání orú di.


I gēwere ọtutu nkpuru-ọghigha pua je n'ubi, ma ọ bu nwantī ka i gāchikọta; n'ihi na igurube gērichapu ya.


I gāku ubi-vine di iche iche, lu kwa ha, ma ọ dighi manya-vine i gāṅu, i gaghi-aghọ kọta kwa nkpuru-vine; n'ihi na ikpuru gēri ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan