Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 49:8 - Bible Nso

8 Otú a ka Jehova siri, Na mb͕e ihe madu nātọm utọ ka M'zaworo gi, ọ bu kwa n'ubọchi nzọputa ka M'nyeworo gi aka: M'gēchebe kwa gi, nye gi ka i buru ọb͕ub͕a-ndu nke ndim, ime ka ala bilie, ime ka ha keta ihe-nketa nile tọb͕ọrọ n'efu;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: “Nʼoge amara m, aga m aza unu, nʼụbọchị nzọpụta aga m enyere unu aka. Aga m echebe unu, mee ka unu bụrụ ọgbụgba ndụ nye ndị mmadụ, iweghachite ala ahụ na ikegharịkwa ihe nketa ya nke tọgbọrọ nʼefu;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 49:8
31 Iomraidhean Croise  

Onye ahu gēwuru aham ulo, M'gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi.


Riọm, na agamenye gi mba nile ka ha buru ihe-nketa-gi, Na nsọtu uwa ka ha buru ihe-onwunwe-gi.


Ma mu onwem, anamekpere Gi ekpere, Jehova, na mb͕e ọ nātọ Gi utọ: Chineke, n'iba-uba nke ebere-Gi, Zam n'ezi-okwu nke nzọputa-Gi.


Ndi gbazeworo agbaze ka uwa na ndi nile ndi bi nime ya bu: Mu onwem atùwo ogidi nile ya. Selah


I nēchebe onye emeworo ka uche-ya dabere na Gi, ọ we nādizu n'udo: n'ihi na ọ bu Gi ka o nātukwasi obi.


Mu onwem, Jehova, bu onye-nche-ya; na mb͕e nile ọ bula dikasiri ntà ka M'nēdè ya miri: ka onye ọ bula we ghara iji ihe ọjọ leta ya, abali na ehihie ka M'nēche ya.


atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.


Le orùm, onye M'nējide aka; onye nkem M'rọputara, onye ihe-ya tọrọ nkpuru-obim utọ: atukwasiwom ya Mọm; ikpé ka ọ gēweputara mba nile.o


Mu onwem, bú Jehova, akpọwo gi n'ezi omume, M'gējide kwa aka-gi, chebe gi, nye gi ka i buru ọb͕ub͕a-ndu nke ndim, ka i buru kwa ìhè nke mba nile;


abum Onye nēme ka okwu orù-Ya guzosie ike, Nke nēmezu kwa ndum-ọdu ndi-ozi-Ya; Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēbi ya; Nke nēkwu kwa okwu bayere obodo nile nke Juda, si, Agēwu ha; nkpọnkpọ-ebe-ya nile ka M'gēwuli kwa:


N'ihi na, nkpọnkpọ ebe-gi nile na ebe-gi nile tọb͕ọrọ n'efu na ala-gi akwadara akwada, n'ezie ub͕u a i gādikara ndi bi n'ala nkpà, ndi nēloda gi gānọ kwa n'ebe di anya.


M'we tiye okwum nile n'ọnu-gi, ọ bu kwa na ǹdò akam ka M'kpuchiworo gi, iku elu-igwe dika ihe-ọkukú, na itọ ntọ-ala nke uwa, na isi Zaion, Ndim ka i bu.


N'ihi na Jehova akasiwo Zaion obi: Ọ kasiwo nkpọnkpọ ebe-ya nile, me ka ọzara-ya di ka Iden, me ka ala-ya nke ihe nādighi di ka ubi Jehova ab͕ara ogige; obi-utọ na ọṅù ka agāhu nime ya, na ekele, na olu abù ọma.


N'ihi na n'aka-nri na n'aka-ekpe ka i gāb͕asa; nkpuru-gi gēnweta kwa mba di iche iche, ọ bu kwa obodo di iche iche nke tọb͕ọrọ n'efu ka ha gēme ka madu biri nime ha.


Chọnu Jehova mb͕e anāchọta Ya, kpọkuenu Ya mb͕e Ọ nọ nso:


Mb͕e i nēti nkpu, ka ndi i chikọtaworo naputa gi; ma ha nile ka ifufe gēfepu, otù nku-ume gēkupu ha: ma onye ahu nke nab͕abà nimem gēketa ala, nweta kwa ugwu nsọm.


Ndi gēsi n'aru-gi puta gēwu kwa ebe nile bu nkpọnkpọ ebe site na mb͕e ebighi-ebi gara aga: ntọ-ala nke ọtutu ọb͕ọ ka i gēwuli; agākpọ kwa gi Onye-nmechi ntipú, Onye-nkwazi okporo-uzọ ibi ebi.


Ọ̀ bu dika nka ka obubu-ọnu nke M'nārọputa bu? bú ubọchi madu gēweda nkpuru-obi-ya n'ala? Ọ̀ bu iruda isi-ya n'ala dika amì, na ib͕asa-ákwà-nkpe na ntu n'okpuru ya? ọ̀ bu nka ka i gākpọ obubu-ọnu na ubọchi nātọ Jehova utọ?


ikpọsa arọ mb͕e ihe madu nātọ Jehova utọ, na ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀ Chineke-ayi nwere; ikasi ndi nile nēru újú obi;


Ha gēwu kwa ebe nile nke bu nkpọnkpọ ebe site na mb͕e ebighi-ebi gara aga; ebe nile nke tọb͕ọrọ n'efu nke ndi mbu ka ha gēwuli, me kwa ka nkpọnkpọ obodo nile di ọhu, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu nke ọtutu ọb͕ọ gara aga.


M'gēme kwa otù nkpuru ka o si na Jekob puta, na otù onye-nnweta nke ugwum nile ka o si na Juda puta: ndi M'rọputaworo ewe nweta ya, ndi-orùm gēbi kwa n'ebe ahu.


n'ihi na nka bu ọbaram nke ọb͕ub͕a-ndu, nke anāwusiri ọtutu madu ka ewe b͕aghara nmehie.


(n'ihi na Ọ nāsi, N'oge anānara madu nke-ọma ka M'nuru olu-gi, Ọ bu kwa n'ubọchi nzọputa ka M'yere gi aka: le, ub͕u a bu oge anānara madu nke-ọma; le, ub͕u a bu ubọchi nzọputa):


ka ewe to ebube nke amara-Ya, bú nke O were amara me ka ayi nara n'aka-Ya nime Onye ahu Ọ huru n'anya:


na Jisus, bú onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ọhu, na ọbara nke nfesa nke nēkwu nke-ọma kari nke ọbara Ebel kwuru.


Onye n'ubọchi nke anu-aru-Ya, mb͕e Ọ weresiri ikwa-ákwá siri ike na anya-miri che ekpere na aririọ n'iru Onye ahu puru izọputa Ya n'ọnwu, mb͕e anusi-kwa-ra olu-Ya n'ihi na Ọ turu egwu Chineke,


Ma otú ọ di, O ruwo n'ifè-òfùfè nke ka nma, n'uzọ ra otú Ọ bu kwa onye-ob͕ub͕o nke ọb͕ub͕a-ndu ka nma, bú ọb͕ub͕a-ndu nke enyeworo n'iwu n'elu nkwa ufọdu ka nma.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan