Aịzaya 49:4 - Bible Nso4 Ma mu onwem siri, N'efu ka m'dọb͕uworo onwem n'ọlu, n'ihi ihe tọb͕ọrọ n'efu na otù nku-ume ka m'meworo ka ikem gwusia: n'ezie ikpém di n'aka Jehova, ugwọ-ọlum di kwa n'aka Chinekem. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a4 Ma mụ onwe m sịrị, “Ọ bụ nʼefu ka m dọgburu onwe m nʼọrụ. Etufuola m ike m niile nʼihi ihe na-abụghị ihe. Ma ihe ruru m dị nʼaka Onyenwe anyị, ụgwọ ọrụ m dịkwa nʼaka Chineke m.” Faic an caibideil |
Obi gātọm utọ nke-uku nime Jehova, nkpuru-obim gēteghari egwú ọṅù nime Chinekem; n'ihi na Ọ chiriwo uwe nzọputa yikwasim, O werewo uwe-nwuda ezi omume kpuchiem, dika onye nālu nwunye ọhu si ewere ihe ọma ike n'isi ke onwe-ya dika onye-nchu-àjà, na dika nwanyi anālu ọhu si ewere ihe-ejiji-ya nile chọ onwe-ya nma.