Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 49:25 - Bible Nso

25 Ma otú a ka Jehova siri, Ọbuná ndi dike dọtara n'agha ka agēwepu, ọzọ, ihe onye nēme ka madu ma jijiji wetara n'agha, agēme ya ka ọ wepuga onwe-ya; ọ bu kwa onye nāluso gi ọ̀gù, ọ bu kwa umu-gi ka Mu onwem gāzọputa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Ma otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼezie, a ga-esi nʼaka ndị bụ dike nʼagha pụnara ha ndị ha dọtara nʼagha. A ga-esitekwa nʼaka onye na-akpa ike napụta ya ihe ọ dọtara nʼagha. Nʼihi na aga m ebuso ha agha bụ ndị niile na-ebuso gị agha. Aga m anapụtakwa ụmụ gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 49:25
39 Iomraidhean Croise  

M'gāgọzi kwa ndi nāgọzi gi, ọ bu kwa onye nākọcha gi ka M'gābu ọnu: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke uwa nime gi.


Jehova, luso ha ọ̀gù, bú ndi nālusom ọ̀gù: Buso ha agha, bú ndi nēbusom agha.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ibu arọ́ ya gēwezuga onwe-ya n'ubu-gi, yoke-ya gēwezuga kwa onwe-ya n'olu-gi, e, agēmebi yoke site na manu.


Imegide mba emeruru emeru ka M'nēziga ya, bayere ndi nke nrubiga-ókè-iwem ka M'nēnye kwa ya iwu, ikwata ihe-nkwata n'agha, na iluta ihe-nluta n'agha, na ido ha ihe-nzọtọ dika apiti nke èzí.


N'ihi na Jehova gēnwe obi-ebere n'aru Jekob, Ọ gārọputa kwa Israel ọzọ, do ha n'ala-ha: ọbìa gārapara kwa n'aru ha, ha gēme kwa onwe-ha ka ha na ulo Jekob dikọ n'otù.


Ndi nile di iche iche gēkuru kwa ha, me ka ha biarue ọnọdu-ha: ulo Israel gēketa kwa ha n'ala Jehova ibu ndi-orù na ibu ndinyom nēje ozi: ha gāghọ kwa ndi nādọta ndi nādọta ha-ri n'agha n'agha; ha gēnwe kwa ike n'aru ndi nāchi ha-ri n'ihe-ike.


Ọ gābu-kwa-ra Jehova nke usu nile nke ndi-agha ihe-iriba-ama na ihe-àmà n'ala Ijipt: n'ihi na ha gētiku Jehova n'ihi ndi-nmeb͕u, O gēzite-kwa-ra ha onye-nzọputa na onye gāluru ha ọ̀gù, O we naputa ha.


N'ihi na I buworo onye nēnweghi ike ebe siri ike, I buworo ob͕eye ebe siri ike nime nkpà nākpa ya, ebe-nb͕abà ipu n'oké miri-ozuzo, ǹdò ipu n'okpom-ọku, mb͕e oké ifufe nke ndi nēme ka madu na jijiji di ka oké miri-ozuzo nāmakwasi mb͕idi.


Agāsi kwa n'ubọchi ahu, Le, Chineke-ayi ka Nka bu; ayi elewo anya Ya, Ọ gāzọputa kwa ayi: Nka bu Jehova; ayi elewo anya Ya, ka ayi tegharia egwú ọṅù ṅuri kwa na nzọputa-Ya.


N'ihi na Jehova bu onye-ikpe-ayi, Jehova bu onye nēnye ayi iwu, Jehova bu eze-ayi; Ya onwe-ya gāzoputa ayi.


Sinu ndi obi-ha nēme ngwa, Dinu ike, unu atula egwu: le, Chineke-unu! ibọ̀-ọ́bọ̀ nābia, bú nkwughachi nke Chineke; Ya onwe-ya gābia zọputa unu.


Gwanu Jerusalem okwu gābà ya n'obi, kpọ-kwa-nu ya òkù, si, na obubu-agha-ya ezuwo, na ahuhu ajọ omume-ya atọjuwo Chineke utọ, na ọ natawo n'aka Jehova okpukpu abua n'ihi nmehie-ya nile.


uja ha nāb͕ọ di ka nke nne-ọdum, ha nāb͕ọ uja dika umu-ọdum; e, ha nēbib͕ọ, jide anu-ndọb͕u, buru ya la, ma onye-nnaputa adighi.


Onye-nkpọrọ nke nēruda eruda emewo ngwa ka atọpu ya; ọ gaghi anwu kwa we rida n'olùlù, nri-ya agaghi-akọ kwa ukọ.


otu a ka Onye-nwe-gi siri, bú Jehova, na Chineke-gi Nke nēkpe ọnu ndi-Ya n'ikpe, Le, ewepuwom n'aka-gi iko nke isu-ngọngọ, bú ọkwa ahu nke bu iko nke ọnumam; i gaghi-aṅu kwa ya ọzọ:


Ọzọ, umu-gi nile gābu ndi-nmuta Jehova; udo nke umu-gi gāba kwa uba.


M'gānaputa kwa gi n'aka ndi ọjọ, b͕aputa gi n'aka ndi nēme ka madu ma jijiji.


N'ihi na otú a ka Jehova siri, Mb͕e ọgu arọ atọ na iri ruzuru nye Babilon, M'gēleta unu, me ka ezi okwum ahu guzosiere unu ike, n'ime ka unu lata n'ebe a.


N'ihi na Jehova ab͕aputawo Jekob, me ka ọ pua n'aka onye dikariri ya ike nwere onwe-ya.


Ma ọ buru na ab͕aputaghi ya n'arọ ndia, ọ gābu kwa n'arọ jubile, ya onwe-ya, na umu-ya tiyere ya.


Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēsure kwa ub͕ọ-ala-ya n'anwuru-ọku, ọ bu kwa umu-ọdum-i ka mma-agha gēripia: M'gēbipu kwa anu-ndọb͕u-gi n'uwa, agaghi-anu kwa olu ndi-ozi-gi ọzọ.


Nka gābu kwa ihe-otiti nke Jehova gēji ti ndi nile di iche iche ndi busoworo Jerusalem agha: anu-aru-ha nile n'otù n'otù gātasi ata mb͕e ha onwe-ha nēguzo n'ukwu-ha, anya-ha gātasi kwa ata n'oghere-ha, ire-ha gātasi kwa ata n'ọnu-ha.


Jehova gāpu kwa, buso mba ahu nile agha, dika n'ubọchi O buru agha n'ubọchi ilu-ọ̀gù.


Gi onwe-gi kwa, n'ihi ọbara ọb͕ub͕a-ndu-gi ka M'zipuworo ndi-nkpọrọ-gi n'olùlù nke miri nādighi nime ya.


Ma ọ dighi onye ọ bula puru ibà n'ulo onye di ike, na ipunara ya ihe-ya nile, ma ọ buru na o bughi uzọ ke onye ahu di ike ab͕u; mb͕e ahu ọ gāpunara kwa ya ihe di n'ulo-ya.


Ma Jerusalem nke di n'elu nwere onwe-ya, ya onwe-ya bu kwa nne ayi.


onye nēme nmehie si n'ekwensu puta; n'ihi na ekwensu nēmehie site na mbu. Ihe eji me ka Ọkpara Chineke puta ìhè bu nka, ka O we la ọlu nile nke ekwensu n'iyì.


Ka obi nātọ gi utọ n'isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n'ihi na Chineke kpere ikpé-unu n'aru ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan