Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 49:24 - Bible Nso

24 Àgānara dike ihe o wetara n'agha, ma-ọbu ndi onye ezi omume dọtara n'agha, àgēme ka ha wepuga onwe-ha?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 A ga-anara dike nʼagha ihe ọ lụtara nʼagha, maọbụ zọpụta ndị a dọọrọ nʼagha site nʼaka onye afọ tara mmiri?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 49:24
17 Iomraidhean Croise  

Ma mb͕e ihe nile a gasiri, nke nābiakwasi ayi n'ihi omume ọjọ nile ayi, na n'ihi ikpe-ọmuma uku ayi, n'ihi na Gi onwe-gi, bú Chineke-ayi, eb͕ochiwo ahuhu-nmehie-ayi, ka ọ ghara idi elu ka ajọ omume-ayi, I we nye ndi-nb͕apu di otú a,


N'ihi na ndi-orù ka ayi bu; ma Chineke-ayi arapughi ayi n'ọbubu-orù-ayi, kama O setiwo ebere rue ayi aru n'iru ndi-eze Peasia, idebere ayi ndu, iwuli ulo Chineke-ayi elu, na ime ka nkpọnkpọ-ebe-ya nile guzo, na inye ayi mb͕idi nime Juda na nime Jerusalem.


Ma Gi onwe-gi bu onye ezi omume bayere ihe nile nke biakwasiworo ayi; n'ihi na ihe bu ezi-okwu ka I meworo, ma ayi onwe-ayi emebiwo iwu:


Ọ nēme-kwa-ra ndi-eze ọtutu ihe-ọmume, bú ndi I doro ndi-isi-ayi n'ihi nmehie nile ayi: ha nāchi kwa aru-ayi, na n'etiti anu-ulo-ayi, dika ọ nātọ ha utọ, ọ bu kwa na nkpab͕u uku ka ayi nọ.


Ma ndi nka bu ndi alutaworo ihe-ha n'agha na ndi apunaraworo ha ihe; ha adawo n'ib͕udu n'olùlù, ha nile, ọ bu kwa n'ulo-nkpọrọ di iche iche ka ezobeworo ha: ha aghọwo ihe-nluta-n'agha, ma ọ dighi onye-nnaputa; ha aghọwo ihe apunaraworo madu, ma ọ dighi onye nāsi, Nyeghachi.


uja ha nāb͕ọ di ka nke nne-ọdum, ha nāb͕ọ uja dika umu-ọdum; e, ha nēbib͕ọ, jide anu-ndọb͕u, buru ya la, ma onye-nnaputa adighi.


N'ihi nka ka M'gēkère ya òkè n'etiti ndi bara uba, o gēso kwa ndi nwere ume kèsa ihe ọ kwatara n'agha; n'ihi na ọ b͕apuru nkpuru-obi-ya dika miri nye ọnwu, ọ bu kwa na ndi-njehie ka aguru ya: ma ya onwe-ya bupuru nmehie ọtutu madu, ọ bu kwa ndi-njehie ka ọ nāriọrọ aririọ.


O we sim, Nwa nke madu, ọkpukpu ndia, ulo Israel nile ka ha bu: le, ha nāsi, Ọkpukpu-ayi akpọwo nku, olile-anya-ayi alawo kwa n'iyì; ebipusiwo ayi onwe-ayi.


O we sim, Nwa nke madu, Ọkpukpu ndia, hà gādi ndu? M'we si, Onye-nwe-ayi Jehova, Gi onwe-gi mara.


Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēsure kwa ub͕ọ-ala-ya n'anwuru-ọku, ọ bu kwa umu-ọdum-i ka mma-agha gēripia: M'gēbipu kwa anu-ndọb͕u-gi n'uwa, agaghi-anu kwa olu ndi-ozi-gi ọzọ.


Ma-ọbu màdu gēsi aṅa pu ibà n'ulo onye di ike, na ipunara ya ihe-ya nile, ma ọ buru na o bughi uzọ ke onye ahu di ike ab͕u? mb͕e ahu ọ gāpunara kwa ya ihe di n'ulo-ya.


Ma ọ dighi onye ọ bula puru ibà n'ulo onye di ike, na ipunara ya ihe-ya nile, ma ọ buru na o bughi uzọ ke onye ahu di ike ab͕u; mb͕e ahu ọ gāpunara kwa ya ihe di n'ulo-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan