Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 49:21 - Bible Nso

21 I gāsi kwa n'obi-gi, Ònye muru ndia nyem, ebe mu onwem bu onye ab͕abaworo aka umu, na nwanyi-àgà, na onye emeworo ka ọ je biri n'ala ọzọ, na onye ewezugara ewezuga? ma ndia, ònye mere ka ha toputa? Le, mu onwem fọduru, náním; ndia, òle ebe ha nọ?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Mgbe ahụ, ị ga-eche nʼime onwe gị sị, ‘Onye mụtaara m ọtụtụ ụmụ ndị a niile? A dịrị m ka nwanyị na-amụghị nwa maọbụ onye ụmụ ya nwụchara. Onye ajụrụ ajụ na nke e mere ka ọ gaa biri nʼala ọzọ. Mụ onwe m fọdụrụ, naanị m. Onye kwa mụụrụ m ụmụ ndị a? Onye zụlitere ha?’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 49:21
21 Iomraidhean Croise  

Ma ada Zaion fọduru dika ulo-ntu n'ubi-vine, dika ulo-ọnọdu-abali n'ubi cucumbei, dika obodo nke ndi-iro-ya nēche nche.


N'ihi na obodo ewusiri ike nọ nání ya, ebe-obibi ajuru aju na nke arapuru arapu, dika ọzara: n'ebe ahu ka nwa-ehi gāta nri, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ gāmakpu, richapu alaka-ya nile.


Ma mb͕e ọ nāhu umu-ya, bú ọlu akam abua, n'etiti ya, ha gēdo aham nsọ; e, ha gēdo Onye Nsọ nke Jekob nsọ, ọ bu kwa n'iru Chineke nke Israel ka ha gāma jijiji.


Ọnu-uzọ-ya nile gēze ume, ru kwa újú; agēme kwa ka ọ tọb͕ọrọ n'efu, ọ gānọdu n'ala.


N'ihi nka ndim ejewo biri n'ala ọzọ, site n'amaghi-ama: ndi-nsọpuru-ha bu kwa ndi agu nāgub͕u, ìgwè-ha bu kwa ndi akpiri miri nākpọsi nku ike.


Rurupu onwe-gi, si n'ájá puta; bilie, nọdu ala, Jerusalem; tọpu onwe-gi ab͕u di n'olu-gi, gi ada Zaion adọtara n'agha.


N'onọdu ibu onye arapuru arapu na onye anākpọ asì nke i buworo, nke ọ nādighi onye nāgabiga n'etiti gi, M'gēme gi ka i ghọ nbili-elu ebighi-ebi, na ihe obi-utọ nke ọtutu ọb͕ọ.


Òle ndi bu ndia nke nēfe efe dika igwe-oji, ndi nēfe kwa dika nduru si eferue window-ha?


Agaghi-agu kwa gi aha Nwanyi arapuru arapu ọzọ; agaghi-agukwa ala-gi aha Ala tọb͕ọrọ n'efu ọzọ: n'ihi na gi ka agākpọ Hefzi-ba, agākpọ kwa ala-gi Beula: n'ihi na ihe-gi nātọ Jehova utọ, agālu kwa ala-gi dika nwunye.


Obodo nsọ Gi nile aghọwo ọzara, Zaion aghọwo ọzara, Jerusalem aghọwo ebe tọb͕ọrọ n'efu.


Ha gāda kwa site n'ọnu mma-agha, agādọta kwa ha n'agha ga na mba nile: ndi mba ọzọ gāzọda Jerusalem n'ala, rue mb͕e oge nke mba ọzọ gēmezu.


N'ihi na asi na ebipuru gi onwe-gi n'osisi olive nke bu nke ọhia ka o si puta uwa, ewe nyakudo gi n'osisi olive ọma n'uzọ nke nēmegide ka o si puta uwa: àgēsi aṅa ghara inyakudo kari ndi ahu nke-uku, bú alaka osisi olive ji puta uwa, n'osisi olive nke aka ha?


Ma ọ buru na unu onwe-unu bu ihe di n'aru nke Kraist, ya mere unu bu nkpuru Abraham, buru ndi-nketa dika nkwa si di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan