Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 49:15 - Bible Nso

15 Nwanyi, ọ̀ gēchezọ nwa-ya nāṅu ara, we ghara inwe obi-ebere n'aru nwa afọ-ya? e, eleghi anya ndia gēchezọ, ma Mu onwem agaghi-echezọ gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 “Nwanyị ọ pụrụ ichezọ nwa ya na-aṅụ ara, hapụ inwe obi ebere nʼahụ nwa si nʼafọ ya? Eleghị anya ọ pụrụ ichezọ, ma agaghị m echezọ unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 49:15
24 Iomraidhean Croise  

Àkpà-nwa gēchezọ ya, aru-ya gātọ ikpuru utọ n'oriri; Agaghi-echeta kwa ya ọzọ: Agānyaji kwa ajọ omume dika osisi.


Dika nna si enwe obi-ebere n'aru umu-ya, Otú a ka Jehova nwere obi-ebere n'aru ndi nātu egwu Ya.


N'ihi na nnam na nnem arapuwom, Ma Jehova gēkubatam.


Ọ̀ chezọwo ime amara, bú Chineke? Ò kpuchitawo obi-ebere-Ya nile n'iwe? Selah


Gini, nwam? gini kwa, nwa nke afọm? Gini kwa, nwa nke nkwa nile m'kwere?


N'ihi na Jehova gēnwe obi-ebere n'aru Jekob, Ọ gārọputa kwa Israel ọzọ, do ha n'ala-ha: ọbìa gārapara kwa n'aru ha, ha gēme kwa onwe-ha ka ha na ulo Jekob dikọ n'otù.


Cheta ihe ndia, Jekob; gi Israel kwa, n'ihi na orùm ka i bu: akpuwom i; orù M'nwere ka i bu: Israel, M'gaghi-echezọ gi.


Ma Zaion siri, Jehova arapuwom, Onye-nwe-ayi echezọwokwam.


N'ihi na ugwu nile gāpu n'ọnọdu-ha, agēwezuga kwa ugwu ntà nile n'ọnọdu-ha; ma eberem agaghi-esi n'ebe i nọ pua, agaghi-ewezuga kwa ọb͕ub͕a-ndu nke udo nkem n'ọnọdu-ya, ka Onye nwere obi-ebere n'aru gi siri, bú Jehova.


Efraim, ọ̀ bu nwa-nwoke di oké ọnu-ahia M'nwere? ọ̀ bu nwa nātọm utọ nke-uku? n'ihi na ka mb͕e ra M'nēkwu okwu megide ya, anamecheta ya nke-ọma rue ub͕u a: n'ihi nka ngiri-afọm adaworo ya udà; aghaghm inwe obi-ebere n'aru ya ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


N'ihi na Israel, ma-ọbu Juda, abughi nwanyi nke di-ya, bú Chineke-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwuru anwu; ọ bu ezie na ala-ha juputara n'ikpe-ọmuma megide Onye Nsọ nke Israel.


Aka ndinyom ndi nwere obi-ebere esiwo umu-ha n'ite; Ha aghọworo ha ihe-oriri na ntipia nke ada ndim.


Ọbuná nkita-ọhia eseputawo ara, me ka umu-ha ṅua ara: Ada ndim aghọwo onye nēnweghi obi-ebere, dika enyi-nnunu n'ọzara.


Mb͕e Israel bu nwata, ahurum ya n'anya, ọ bu kwa site n'Ijipt ka M'kpọputara nwam.


Unu gēri anu-aru umu-unu ndikom, anu-aru umu-unu ndinyom ka unu gēri kwa.


Ha gābu kwa nkem, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, n'ubọchi ahu mḅe Mu onwem ganēme ihe, bú ihe nke akam; M'gēnwe kwa ọmiko n'aru ha, dika madu si enwe ọmiko n'aru nwa-ya nke nēfè ya.


Ya mere, ọ buru na unu onwe unu, ọ bu ezie na unu jọrọ njọ, ma unu nāmata inye umu-unu ezi onyinye, Nnà-unu Nke bi n'elu-igwe gēsi aṅa ghara iwere kari ezi ihe nke-uku nye ndi nāriọ Ya?


Ndi nēnweghi nghọta, ndi nēmebi ọb͕ub͕a-ndu, ndi ihe madu-ibe-ha nādighi-atọ utọ, ndi nēnweghi obi-ebere:


N'ihi na Jehova agaghi-arapu ndi-Ya n'ihi aha uku Ya: n'ihi na Jehova ekwewo ime unu ka unu buru Ya otù ndi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan