Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe; tegharia egwú ọṅù, gi uwa; tiwanu nkpu ọṅù, unu ugwu: n'ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru ndi-Ya ewedara n'ala.
Site n'ebe di anya ka Jehova mere ka m'hu Ya, si, Ọ bu ihu-n'anya nke di mb͕e ebighi-ebi ka M'jiworo hu gi n'anya: n'ihi nka ka M'meworo ka ebere digidere gi.
Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, si ulo Israel: Otú a ka unu nēkwu, si, N'ezie njehie nile ayi na nmehie nile ayi di n'isi-ayi, ọ bu kwa nime ha ka ayi onwe-ayi nāta aru; àyi gēsi kwa aṅa di ndu?