Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 49:14 - Bible Nso

14 Ma Zaion siri, Jehova arapuwom, Onye-nwe-ayi echezọwokwam.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ma Zayọn sịrị, “Onyenwe anyị agbakụtala m azụ; Onyenwe m echefuola m.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 49:14
14 Iomraidhean Croise  

Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēchezọm ebighi-ebi? Rùe ole mb͕e ka I gēzonarim iru-Gi?


Chinekem, Chinekem, n'ìhi gini ka I rapurum? N'ìhi gini ka I nọ m n'ebe di nzọputam na okwu nile nke ọb͕ub͕ọ-ujam anya?


Ma mu onwem, asirim na nkujam, Ebipuwom n'anya-Gi: Otú ọ di, I nuru olu aririọ-amaram nile mb͕e m'tikuru Gi.


N'ìhi gini ka i nāsi, gi Jekob, ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka i nēkwu, gi Israel, si, Uzọm ezonariworo Jehova, ọzọ, ikpém esiwo n'ebe Chinekem nọ gabiga?


Tienu nkpu ọṅù, unu elu-igwe; tegharia egwú ọṅù, gi uwa; tiwanu nkpu ọṅù, unu ugwu: n'ihi na Jehova akasiwo ndi-Ya obi, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru ndi-Ya ewedara n'ala.


Nwanyi, ọ̀ gēchezọ nwa-ya nāṅu ara, we ghara inwe obi-ebere n'aru nwa afọ-ya? e, eleghi anya ndia gēchezọ, ma Mu onwem agaghi-echezọ gi.


N'ihi na Jehova akpọwo gi dika nwanyi arapuru arapu nke o nēwuta kwa ya nime mọ-ya, bú nwunye alutara na nwata, mb͕e ajuru ya, ka Chineke-gi siri.


n'ihi nka, le, Mu onwem, M'gēchezọsi kwa unu, chupu unu na obodo ahu nke M'nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, n'irum:


Site n'ebe di anya ka Jehova mere ka m'hu Ya, si, Ọ bu ihu-n'anya nke di mb͕e ebighi-ebi ka M'jiworo hu gi n'anya: n'ihi nka ka M'meworo ka ebere digidere gi.


N'ìhi gini ka I nēchezọ ayi rue mb͕e ebighi-ebi? N'ìhi gini ka I nārapu ayi rue ogologo ubọchi nile?


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, si ulo Israel: Otú a ka unu nēkwu, si, N'ezie njehie nile ayi na nmehie nile ayi di n'isi-ayi, ọ bu kwa nime ha ka ayi onwe-ayi nāta aru; àyi gēsi kwa aṅa di ndu?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan