Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 48:9 - Bible Nso

9 N'ihi aham ka M'nēme ka iwem nọ ọdù, ọ bu kwa n'ihi otutom ka M'nēb͕ochi ya n'ebe i nọ, ka M'we ghara ibipu gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ma nʼihi aha m, ka m na-eme ka ọnụma m jụrụ nʼihi otuto m, a na m egbochi ya nʼebe ị nọ, ka a ghara ikpochapụ unu kpamkpam.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 48:9
22 Iomraidhean Croise  

Ma Ọ zọputara ha n'ihi aha-Ya, Ime ka amara idi-ike-Ya.


N'ihi aha-Gi, Jehova, me ka m'di ndu: N'ezi omume-Gi me ka nkpuru-obim puta n'ahuhu.


N'ihi aha-Gi, Jehova, B͕aghara ajọ omumem, n'ihi na o riri nne.


Ma Ya onwe-ya, ebe O nwere obi-ebere, Ọ nēkpuchi ajọ omume-ha, Ọ dighi-ebibi kwa ha: E, ọtutu mb͕e ka O mere iwe-Ya ka ọ laghachi azu, Ọ dighi-akpọte kwa ọnuma-Ya nile.


Yere ayi aka, Chineke nke nzọputa-ayi, n'ihi nsọpuru aha-Gi: Naputa kwa ayi, kpuchi kwa nmehie-ayi, n'ihi aha-Gi.


Ezi uche madu nēme ka ọ ghara iwe iwe ọsọsọ; Ọ bu kwa ima-nma-ya igabiga njehie.


Ọ bu kwa n'ihi nka ka Jehova gēchere, imere unu amara, ọ bu kwa n'ihi nka ka agēbuli Ya, inwe obi-ebere n'aru unu: n'ihi na Chineke nke ikpé ka Jehova bu; ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nile ndi nēchere Ya bu.


M'gēb͕ochi kwa obodo a izọputa ya, n'ihi Onwem, na n'ihi Devid, bú orùm.


Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu Nke nēchichapu njehie-gi nile n'ihi Mu onwem; M'gaghi-echeta kwa nmehie-gi nile.


N'ihi Mu onwem, n'ihi Mu onwem, ka M'gēme ya; n'ihi na le ka esi me ka aham ghara idi nsọ nke-uku! M'gaghi-enye kwa onye ọzọ nsọpurum.


Otú a ka Jehova siri, Dika anāchọta manya-vine ọhu n'uyọkọ nkpuru-vine, ewe si, Ebibila ya, n'ihi na ngọzi di nime ya: otú a ka M'gēme N'ihi ndi-orùm, ka M'we ghara ibibi ha nile.


Ọ bu ezie na ajọ omume-ayi azawo megide ayi, ma Gi lua olu n'ihi aha-Gi, Jehova: n'ihi na ndaghachi-azu-ayi di ọtutu; Gi ka ayi mehieworo megide.


M'we lua ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta n'anya-ha.


Ma eseghachirim akam, we lua ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi M'mere ka ha puta n'anya-ha.


Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'mesoworo unu n'ihi aham, ọ bughi dika uzọ ọjọ nile unu si di, ọ bughi kwa dika omume nile unu nke bibiri ebibi, unu ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ma alurum ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi ha onwe-ha nọ n'etiti ha, ndi M'mere ka ha maram n'anya-ha, n'ime ka ha si n'ala Ijipt puta.


Ma enwerem ọmiko n'aru aha nsọm, nke ulo Israel mereri ka ọ ghara idi nsọ n'etiti mba nile, ebe ha biara.


Ndi Kenean na ndi nile bi n'ala nka gānu kwa ya, we b͕a ayi buruburu, bipu aha-ayi n'uwa: ọ̀ bu kwa gini ka I gēmere aha uku Gi?


N'ihi na Jehova agaghi-arapu ndi-Ya n'ihi aha uku Ya: n'ihi na Jehova ekwewo ime unu ka unu buru Ya otù ndi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan